World Sickle Cell Day: Onye na-arịa 'Sickle Cell' ga-enwete uru na nri ndị a

Ndị Abatete mere ihe puruiche na iri ha
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dịka taa bụ ụbọchị ncheta ọrịa ọbara nko nke bụ 'Sickle Cell' na Bekee, ndị ọkachamara na nri na ihe ọ na-enye n'ahụ enyela ndụmọdụ ọhụrụ

Florence Ngozi Uchendu kwuru na o nwere ụfọdụ nri ndị na-arịa ọrịa a kwesiri ị na-eri iji chekwa onwe ha ọfụma karịa ndị enweghi ọrịa a.

Anya onye na-arịa ọrịa ọbara nko

Ebe foto si, Getty Images

O kwuru na nri ndị na-enye ike dịka akpụ, ji, osikapa na ndị ọzọ dị mma iji nye ha ike n'ihi na ọrịa a na-agwụ ike.

Ndị Abatete mere ihe puruiche na iri ha

O kwukwara na akwụkwọ nri na mkpụrụ osisi dị icheiche na nye aka ịnye ha ihe ndị na-edozi ahụ.

Ọ kwuru na ọ bụ maka na ndị na-arịa ọrịa anaghị enweta ihe dịkia Ayọn, vitamins, kalshiụm wdg.

Ụgụ
Nkọwa foto, Ụgụ bụ akwụkwọ nri ndị ọrịa ọbara nko kwesiri ị na-eri

Nri ọzọ ọ kpọrọ aha bụ mmiri ala ehi nke ga-enye ha kalshiụm n'ahụ nakwa mmiri ọṅụṅụ nke ga-akwụsị ahụ mgbu.

Dịbia bekee ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ McGinger Ibeneme kwuru na ezigbo nri zuruoke nakwa ihe ndị ọzọ nwereike ịdọtị ndụ ndị na-arịa ọrịa ọbara.

Ha kwesiri ịga ụlọ ọgwụ kwa mgbe kwa mgbe

Ebe foto si, Getty Images

O kwuru na ndị na-arịa ụdịrị ọrịa na-enwe ọtụtụ nsogbu gụnyere ọkpụkpụ mgbu, obi mgbu, ịrịa ahụ mgbe ọbụla.

Ụtazị so n'akwụkwọ nri ndị ọrịa ọbara nko ga na-eri
Nkọwa foto, Ụtazị so n'akwụkwọ nri ndị ọrịa ọbara nko ga na-eri

Kedụ ihe ị ga-eme ka ịnwe ogologo ndụ n'ọrịa a?

Macginger kpọpụtara ihe ndị ha ga-eme iwe bie ogologo ndụ:

  • Rie nri na-edozi ahụ:

Ọ sị ka ha ahọrọla nri ọbụla. Maka na ọ bụ na nri ka ha ga-enye ihe n'ahụ.

  • Aṅụla ọgwụ ayọn
  • Arụla ọrụ ike
  • Anọla ebe jụrụ oyi rinne
  • Anọla ebe ọtụtụ mmadụ gbakọjuru
  • O kwesiri ka ị na-aga ahụ dọkịnta mgbe ọbụla ka olele gị ahụ
Akwụkwọ nri

Ebe foto si, Jessica Nwankwo/BBC

O nwere ụzọ esi egbochi ọrịa a?

Mcginger kwuru na ọ bụ naani site n'inyocha iji wee chọpụta ma onye gị na ya na-alụkọ dị na nwunye ,ma ọbara ụnụ agakọrọ nkeọma.

Nke a gunyere :AS na AS agaghị alụli, mana AS na AA ga-alụli.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia maka ọrịa a

@Taswalu na-arịọ ndị mmadụ ka ha nyocha onwe ha tupu ha lụọ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

@toksy_bee_ chọrọ ka ekpere ya ekpere ya makana ya bụ ọrịa ji ya na njọ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@EkeminiMacauley kwuru na ya na-akwado ndị na-arịa ọrịa a.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Akụkọ ndị ga-amasị gị: