Fulani Herdsmen: "Ahụla m ihe na-adọhachị ndịagha azụ na'ọrụ nchekwa "
Buratai ekwuola ebe nsogbu ya sị

Ebe foto si, Nigeria Army/Twitter
Ọchịagha ndị agha Naịjirịa bụ Tukur Buratai ekwuola ihe mere agha a na-ebuso ndị ọmekataraihepụụjọ ekweghị ebi ebi.
O sị na ọ bụ gịnị mere ya?
Buratai sị na ụfọdụ ndị ọrụ ya anaghị etinye ezi uchu n'ọrụ dịka okwesiri ma gwakwa ndị ọbụla nke a metutera ha nye efe n'ọrụ mgbe oge ka dí.
Maka iwu onye apụla ezi na Taraba steeti

Ebe foto si, Getty Images
Na Taraba steeti, gọmenti steeti ahụ amaala iwu onye apụla ezi site elekere anọ nke mgbe ruo n'elekere isii nke ụtụtụ.
Nke a bụ maka mwakpọ ndị oji egbe achi ehi nke tara isi mmadụ iri na asatọ ụbọchị Monde.
Trump amalitela nta vootu
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Igbo sị na emee ngwa ngwa emeghere ọdachi, ha mere Onyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump ji malite achụmnta vote maka ntuliaka nke onyeisiala nke 2020.
Trump rịọrọ ndị Florida bụ ebe ọ nọ kwuo nke a, ka ha biko kwado ya ma jiri votu ha chekwa gọmentị ya.
Platini na-azara ọnụ ya n'ụlọọrụ mpụ na ngarị mba France

Ebe foto si, Reuters
N'egwuruegwu, a na-agba Michel Platini ajụjụ ọnụ ka ọ kọwaa ihe mere e ji bugaa iko mbaụwa nke 2022 Qatar agbanyeghị na mba ahụ etozughị etozu.
Ụlọọrụ na ahụ maka nrụrụaka na-enyocha ya bụ mkpebi ka ha mata ka aka enwe sị bata na ya bụ ofe.
Chete na amachiri Platini dịka onyenchịkọta egwuruegwu ndị Urop kemgbe afọ 2015 maka ebubo ụrụaka.










