Ihe anọ ị maghị maka ọrịa ịba

Ebe foto si, Getty Images
Ihe karịrị ọkara mmadụ niile nọ n'ụwa gbaa gburugburu nwere nsogbu ọrịa ịba.
Ịba bụ ọrịa a na-ebute site n'ọtịta anwụnta nke na-egosi onwe ya site na ahụọkụ na oyi ọmụma.

Ebe foto si, Getty Images
Kedụ ihe mere n'agbanyeghị mbọ a na-agba megide ya, achụpụbeghị ya? Kedụ ụzọ anyị ga-esi chekwaba onwe anyị ịgbalahụ ọrịa ịba na mmefu ego dị na ị rịa ya?
Ajụjụ a na ndị ọzọ ka Onye ọkamụta Dọkịta Chukwujekwu Ezechi onye nyocha na Nigeria Institute of Medical Research (NIMR) na ndị ọzọ zara:
1. Mmadụ ole na-arịa ịba n'ụwa?
Mmadụ nde nari abụọ na iri isii (216m)rịara ịba na mba iri itoolu na n'ụwa n'afọ 2016.
2. Kedụ mpaghara kacha nwe nsogbu ịba?
Ndị isi ojii Afrịka bụ ndị ọrịa ka emekpa ahụ. Pasentị iri itoolu ndị na-arịa n'ọrịa ịba nọ n'Afrịka, ebe o gbuola ihe ruru pasentị iri itoolu na otu.
3. Gini mere na anyị ekpochapụbeghị ịba?
Dịka Dkta Ezechi is kọwa, ihe kachasị egbochi Naijiria imeri ịba bụ ; Anaghị etinye uchu nanchọpụta gbasara ịba, gọọmenti anaghị etinye ego na mbọ ịchufu ọrịa iba nakwa ndị mmadụ anaghị echekwa gburu gburu ha.

Ebe foto si, AFP
4. Kedụ ka ị ga-esi mgbochi ọrịa ịba?
Site na idebe gburugburu gị ọcha, ịlahụ n'ime akwa mgbochi anwụnta na ime nyocha ọbara tupu ibido ịgwọ ịba.
Dr Ezechi sị: "Ihe na-ebute ịba bụ anwụ. Ọ na-eto n'ebe mmiri adịghị ọcha dọ. Ọ dị mkpa ka ndị mmadụ kpochapụ ngwongwo dịka komkom, karama kụwara akụwa na taya na gburugburu ha."
Ahụ ọkụ niile abụghị ịba. Maka ịgbalahụ ọgwụ ịba ịnyụ ọkụ n'ihe gbasara ọgwụgwọ ịba, ndị ọkachamara ahụike gụnyere WHO na-adụ ndị mmadụ ka ha mee nyocha ọbara tupu ha ebido ịgwọ ahụokụ ọbụla ha chere na ọ bụ ịba.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:









