Thelma Chiaka: 'Dọkịta kwuru na ụmụ anọ dị n'afọ m, mana isii ka m mụpụtara'

Aha onyonyo, "Echere m na m dị ime ejima anọ, mana ejima isii ka m mụrụ" - Thelma Chiaka

Ifeoma Thelma Chiaka na di ya Onyemaechi chọrọ ụmụ ka ha mechara agbamakwụkwọ ha. Ka afọ ise gachara, ọ tụrụ ime site n'enyemaka IVF.

Mgbe ọ gara nyocha afọ ime ya, Thelma chọpụtara na ọ dị ime ejima anọ.

Mgbe ọzọ ọ gara, ọ hụ na ọ bụzị ejima ise.

Ka ọ na-amụ pụta ụmụ ya, ejima isii ka ọ mụpụtara.

Na mkparịtaụka anyị na ha nwere, Ifeoma na Onyemaechi kọwara ije ha gara ịmụta ụmụ ha na ọnọdụ ha ugbua dị ka nne na nna.

Ndị mere ya: Chioma Nkemdilim Daramola, Jessica Nwankwo na Chiemela Mgbeahuru