Onye bụ Ugo SARS ndị mmadụ kpụ n'ọnụ n'Enugu?

Dịka ndị ntorobịa ka na-eme ngagharịiwe na Naịjirịa gbasara mmekpa ahụ ndị uweojii, ọ kachcasị ndị ngalaba 'Special Anti-Robbery Squad' (SARS), ụfọdụ ndị bi n'Enugwu kpụkwa onye ọzọ a kpọrọ 'Ugo SARS', n'ọnụ.
BBC ka na-agba mbọ ịchọpụta ma ebubo niile ahụ abụcha eziokwu.
Onye bụ Ugo SARS?
BBC ji onyonyo ndị mmadụ na-etinye na soshal midia wee mee nnyocha na ịntaneetị.
- Anyị chọpụtara na ezigbo aha ya bụ Ugochukwu Ozoude, dịka o si dee n'akara Facebook ya.
- Ọ bụ onye Enugwu steeti
- Ọ kọwara onwe ya dịka onye ndụmọdụ otu nchekwa nke ndị otu mba ụwa bụ 'United Nations' dị na Darfur, na mba Sudan.
- O dekwara na ya bụbu onye ọrụ uweojii na Naịjirịa
- Ndị mmadụ kwuru na aha ọzọ e ji mara ya bụ Ugo 2-2
- Ụfọdụ sị na Ugo bụ onye isi ndị SARS, mana BBC chọpụtara na ọbụghị onyeisi.
- Oge Ugo rụrụ ọrụ na SARS, malite na 2009 ruo 2011, onye isi ha bụ Jude Agbanajelu larala mmụọ.
- N'oge ahụ, Ugo ji ọkwa 'corporal' mana o mechara gaa ọzụzụ nke mere ka e bulie ya n'ọkwa 'superintendent'
Ọtụtụ mmadụ na soshal midia na-akpọ Ugo Sars aha banyere okwu a kpụ n'ọnụ na Naịjirịa ugbua, bụ mkpagbu na mmekpa ahụ n'aka ndị uweojii, mana e nweghị onye n'ime ha wepụtara ihe akaebe iji gosi na o mere ihe ndị ahụ n'ezie.
Kama ụfọdụ kwukwara na ha ma Ugo Sars dịka ezigbo onye uweojii.
lỤlọọrụ ntaakụkọ Vanguard dere akụkọ na-akọwa na ọ bụ ebubo ụgha ka ndị mmadụ na-ebo Ugochukwu Ozoude na ndị otu ya.
N'ime akụkọ ahụ, mmadụ abụọ - Obiora Anichukwu na Emeka Ifedi - kọwara Ugo SARS dịka onyeuweojii kwụbara aka ya ọtọ ma na-arụ ọrụ ya nke ọma.
Mgbe BBC kpọrọ Ugochukwu Ozoude, o kwuru na ebubo niile ahụ bụ asị, mana dịka onye uweojii, onweghi ikike ịgwa ndị ntaakụkọ okwu, ọ bụ ndị isi ha ka ọ dị n'aka ime nke a.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugu steeti bụ, Daniel Ndukwe, azaghị oku anyị kpọrọ ya n'ekwentị, maọbụ zaghachi ozi anyị zigaara ya.









