Awkuzu SARS: Onye bụ James Nwafor a Obiano si na ya chụrụ n'ọrụ?

A tụrụ anya na onye bụbu onyeisi ndị Uweojii SARS n'ọkụzụ bụ Maazị James Nwafor ga-abịa zara ọnụ n'ogige ndị gọọmenti hibere inyocha ebubo a na-ebo ya na ndị otu ya ọzọ mana anya ahụghị ya.
Ọkaikpe Veronica Umeh bụ onyeisi ọgbakọ gọọmenti hibere a kpọrọ "Judicial Panel of Inquiry into Police Brutality, Extra-Judicial Killings and other Matters", malitere okwu eji bịa n'ebe ọ ji ọkara ga elekere iri na otu nke ụtụtụ. Okwu mbụ e tinyere ọnụ bụ nke metụtara ezinaụlọ Ezemgbu si Ihiala.

Mkpebi Panel were bụrụ na nwunye nwa Ezemgbu a na-ebo ndị Uweojii ebubo na ha gburu ga-abịa jiri ọṅụ ya kwuo ihe ọ hụrụ, makana onye bịara nnọchiteanya ezinaụlọ ahụ ahụghị ihe mere n'anya ya.
Ọkaiwu Abdul Mahmud bụ onye nochitere anya ezinaụlọ Iroanya, Akabuike, Adimachukwu na ndị ọzọ si na ya emechara mkpesa banyere okwu ọ ji bịa.
Okwu ọ ji bịa bụ nke metụtara onye bụbu onyeisi ndị Uweojii na Special Anti-Robbery Squad (SARS) n'ọkụzụ bụ Maazị James Nwafor.
Maazi Mahmud kwuru na ụlọ mkpesa ahụ kpọrọ òkù ma nye iwu ka ndi Uweojii kpọta James Nwafor mana anya ahụghị ya.
Ụlọ mkpesa kwenyere na enwere akaebe na ozi maka ịkpọta) James Nwafor ruru ndị Uweojii n'Abuja aka.
Ọkaiqu ndị Uweojii bụ Maazị Innocent Obi kwenyere na asị ka akpọta James Nwafor mana ya agaghị asanwu ihe mere o jighị bịa. Ọ si na nke ahụ adịghị ya n'aka.
Maazị Mahmud jụrụ ma ụlọ mkpesa ahụ ọ nwere ikike ịmanye ndị Uweojii ka ha kpọta onye ha chọrọ ịhụ n'ike.
Ọ sị na mkpebi ya bụ na ụlọ mkpesa ahụ agaghị emenwu etu a, nke mere o jiri si na ya emechara mkpesa banyere ndị ọ na-anọchite anya ha.

Maazị Obi na-anọchite ndị Uweojii si na ya onwe ya enweghị akaebe ya ji aga n'ihu, nke mere na ya onwe ya ga-awụsa ọwa. Ọkaikpe Umeh kpebiri na okwu ndị a niile Mahmud ji eruola na njedebe na tinye mkpebi ha na Janụwarị n'oge ụlọ mkpesa ahụ ga-alaghachite. Ada Iroanya bụ onye nọ n'isi mmiri ịchọ nwanne ya nwoke gwara BBC na obi adịghị ya mma etu ya bụ okwu siri gaa.
Ọ sị "ọkwa anyị abiala ụlọ mkpesa? Ndị mmadụ agaghị asị na anyị emeghị etu ahụ."
Ọ sịrị na ha ka nwere ike gaa ụlọikpe mana ha ga-echi mkpebi ụlọ mkpesa.
Ọ sịkwara na ihe tọrọ ya ụtọ obere bụ na ndị Uweojii kwenyere na ya gburu nwanne ya nwoke.
Ndị ọzọ bi akwara mkpesa gwakwara BBC na ha na-eche mkpebi ụlọ mkpesa.
Mana Ọkaikpe Umeh kọwara na ụlọ mkpesa ahụ enweghị ikike imanye onye ọbụla ime he ọbụla. Ihe ikike nyere ha bụ ikwupute nchọpụta ha nakwa tuzie aka maka iti aka n'obi nakwa ụzọ ikpe ziri ezi.
Dịka gọvanọ na-achị Anambra steeti bụ Willie Obiano na-agwa ndị na-eme ngagharịiwe maka mkpagbu ndị uweojii nọ na ngalaba SARS, o kwuru na ya achụọla onye enyamaka ya aha ya bụ James Eze.
Nke na-abịa dịka aha nwa amadị a na-ewu n'etiti ndị ntoroobịa na-eme ngagharịiwe a.
N'ime ọnwa ole ma ole gara aga, aha James Eze wukwara na soshal midia Naịjirịa dịka ndị mmadụ kpụkwara ya n'ọnụ.
N'oge ahụ, BBC gbara mbọ ịnụta n'ọnụ ya ihe o nwereike ikwu banyere okwu a na-akpọ ya.
N'oge ahu, ekwenti ya agaghị, mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Anambra steeti bụ Haruna Mohammed, etinyere ọnụ na ebubo a na-ebo nwa amadi ahụ were kọwa ha ma ya dịka onye narala ezumike nka.
Ka Maazị Mohammed kwetere na onye a na-ekwu maka ya bụ onye otu ha nara ezumike nka, ọ gbadokwere ụkwụ na ha enwetebeghị mkpesa banyere ihe a asị na o mere.
Ọ sị: "Ọ bu na soshal midia ka anyị hụrụ akụkọ a. O nwebeghi onye bịara kpesara anyị banyere ya. Ọ bụ e mee mkpesa, amalite ime nyocha mara ka o mere n'eziokwu."
Awkuzu SARS: Onye bụ James Nwafor a Obiano si na ya chụrụ n'ọrụ?
James Nwafor bụ onye Ebonyi steeti, mana ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi ngalaba SARS n'Ọkụzụ tupu ọ laa ezumike nka.
Nchọpụta BBC bu na ọ bụ dịka o lara ezumike nka ka gọvanọ Willie Obiano nyere ya ọkwa na gọọmentị ya.
Mana, Komishọna Mgbasaozi n'Anambara bụ Don Adinuba gwara BBC na ya amaghị maka nwoke maọbụ hụtụbe ya anya.
Onye bụ onyeisi ndị uweojii n'oge James Nwafor na-arụ ọrụ n'Ọkụzụ bụ Bala Nasarawa. Ọ rụru ọrụ site n'ọnwa Maachị 2012 ruo Ọgọst 2013.
James Nwafor lara ezumike nka n'ọrụ ndịuweojii n'afo 2018.
Gịnị mere eji chụọ ya n'ọrụ?

Ebe foto si, @WillieObiano
Kọmịshọna Adinuba agwaghị BBC oge Maazị Nwafor malitere ọrụ n'ogige Anambara steeti maọbụ ọrụ ọ na-arụ.
O kwughikwanu ihe mere ejiri chụọ ya n'ọrụ.
Mana. ọ bụ n'ogige ebe ọ na-agwa ndị ntoroọbịa na-eme ngagharịiwe ka Gọvanọ Obiano kwuru na acgụọla nwa amadị ahụ n'ọrụ.
Ọ gịni ka asi na o mere?
Ebubo ka nkụ, mana BBC agaghi itinyenwu ọnụ na ha ma ya bụru na anyi anụtaghị n'ọnụ nwoke ahụ.
N'agbanyeghị nke a, gọọmentị Anambara enyela iwu ka enyochasịa ebubo niile a na-awụsa n'isi nwa amadị a.
N'iwu Naịjirịa, ibo mmadụ ebubo abụghị na mmadu mere ihe ọbụla.

Ebe foto si, Kenneth Udeh
Ọ bụ ụlọikpe ka ọ dịrị itinye anya n'ihe mere ma kpebie nke bu eziokwu.
Ọtụtụ ebobo a dị na soshal midia, Maazị Haruna Mohammed, dịka ọ na-ekwu na-ekwesighi ị na-etinye ụdịrị okwu na soshal midia rụtụrụ aka na oteela ihe a mere ma sị ajụjụ ihe mere oji bụrụ ugbua ka a na-apalite ihe mere kemgbe 2012 dịkwa mkpa ịjụ.
Haruna dọrọ aka na ntị banyere itinye ụdịrị ihe a n'elu soshal midia.











