SARS brutality: A gbajiela nwoke ụkwụ n'ọgụ ndị 'SARS' na ndị ahịa Onitsha Main Market

Ndị na-eme ngagharịiwe

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na ha na-enyocha ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị otu ha na ndị nche ahịa 'Onitsha Main Market' n'ehihie Wenezde.

A gbajiri otu nwoke ụkwụ, ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ merụrụ ahụ n'ọgbaghara dapụtara n'etiti 'Our Lord Plaza' dị n'ụzọ Emeka Offor n'ahịa Main Market Onitsha na ndị uweojii pụrụiche a kpọrọ 'SARS.'

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ndị nọ ebe ihe mere gwara BBC na ihe butere okwu bụ na ndị SARS bịara ị kpụrụ otu onye na-ere ahịa mana ọ nọghị n'ọdọahịa ya.

Onye na-achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC na "Onye ahụ na-ere ekwentị. Ha chọrọ i buru igbe ugegbe o ji akpọsa ahịa ya, mana onyeisi ahịa na ndị ahịa gwara ha ka ha hapụ ahịa maọbụ ha chere ka a gụọ ngwaahịa ọnụ tupu ha e buru ya."

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ọ gara n'ihu kọwaa na ndị uweojii ahụ gbara isi akwara ma sie ọnwụ na ha ga-ebu ahịa ahụ pụọ nke mere ka ndị ahịa ahụ gbakọọ ma jụ inye ha ohere.

O kwuru na otu n'ime ha gara n'ụgbọala ha bute egbe ma gbaa otu onye na ndị nche ahịa n'ụkwụ.

Ndị ntoroọbịa na ndị nche niile nọ n'ahịa were iwe ma gbakọta mana "ndị SARS gbawara ọsọ."

Aha onyonyo, Okwu Immanuel James Ibe-Anyanwu maka nwakpo SARS wakporo ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Haruna Mohammed gwara BBC Igbo na ebe niile ihe a mere ederela jụụ ugbua.

Mohammed kwukwara na "Kọmịshọna ndị uweojii John Abang enyeela iwu ka e nyocha ihe mere ma kwe nkwa na a ga-ata ndị ikpe mara ahụhụ kwesịrị."