Mbaka Ejike: Ọ saala Garba Shehu maka ebubo na ọ nara gọọmenti etiti ọrụ ngo

Ebe foto si, Shehu na Mbaka social media
Father Ejike Mbaka nke Adoration Ministry Enugwu ekwuola na ebubo na ọ nara gọọmenti etiti ọrụ ngo bụ ihe ikpa ọchị.
O kọwara na ọ kpọrọ ụmụnwoke ndịọcha atọ gakwuru gọọmenti etiti makana ha gwara ya na ha nwereike inye aka gboo mkpa enweghị ezi nchekwa ma nye ndị ntorọbịa ọrụ.
Mana gọọmenti etiti jụrụ inabata ụmụnwoke atọ ahụ.
O kwuru na ihe a mere mgbe Abba Kyari ka dị ndụ.
Mbaka kwuru sị, "Father Mbaka bụ onye ikpeazụ ọchịchị Buhari ga-alụsọ ọgụ makana ha mee ya, iwe Chukwu ga-adakwasa ha ma memina ha n'ụzọ ga-atụ ndị mmadụ n'anya."
O kwuru na Garba Shehu kwesiri ịbia tụọ mma mma n'ụlọụka ya maka etu Chineke si zọọ ha maka ihe ha gabigagoro n'ọchịchị a.
Mbaka kwuru na ọ bụrụ na uche na-eche ha na ọ na-agọzị Nnamdi Kanu, na Kanu bụ nwa ya mabụrụkwa nwanne ya.
Ọ gwara gọọmenti etiti ha mara ka ha si akpọọ ndị mmadụ oyi egwu.
O kwuru na ahụhụ dị na Naịjirịa ugbua mere ka ndị ntoroọbịa Naịjirịa gbapụ gawa obodo ọzọ ha chee ka mma.
Cheta na ụlọọrụ onyeisiala kwuburu na ihe mere Father Ejike Mbaka nke Adoration Ministry Enugwu ji akpọ oku ka a chụtuo Buhari n'ọkwa Onyeisiala bụ na Buhari jụrụ inye ya ọrụngọ.
Ha kwuru na Mbaka kpọrọ ndị ọrụ ngo atọ bịa ịhụ onyeisiala ka enye ha ọrụ ngọ mana Buhari enyeghị ha n'ihi na e nwere usoro ọrụ nye ọrụ ngo.
Mbọ niile BBC Igbo gbara ị nweta Garba Shehu n'ekwentị ka o tinye ọnụ na ya bụ okwu amutaghị mkpụrụ.

Ebe foto si, Adoration Ministry/ Getty Images
Ebubo na-abịa abalị ole na ole Mbaka kpọrọ oku ka Buhari rituo n'ọkwa dịka nsogbu nchekwa n'akawanye njọ maọbụ ndị ụlọomeiwu achụtuo ya.
N''ozi Ọnụ na-ekwuru onyeisiala Buhari bụ Garba Shehu,wepụtara n'akara Twitter na mgbede Fraide, kwuru na ọ bụ kemgbe nke a mere ka Mbaka gbakọtara Buhari azụ.
"Father Mbaka rịọrọ ka ya na Buahri zute mana nke tụrụ ndị nnyemaka onyeisiala bụ na ọ kpọ ndị 'contractor' atọ bịa. Onyeisiala nabatara ha. Nke tụrụ onye ọbụla n'anya bụ na Fada Mbaka si ka enye ya ọrụ ngo iji ti ya aka n'obi maka nkwado ya."
"Onye ọbụla ma Onyeisiala Buhari ma na ọ naghị achọ ịda iwu n'inye ọrụ ngo maọbụ ihe ọbụla gbasara gọọmentị. Ọ gwara ụl,ọrụ ọ metụtara ka ha lebanye anya na ya dịka iwu siri dị."
Shehu gara n'ihu kwuo na Ụlọọrụ Onyeisiala ewepụtaghị foto na akụkọ ihe mere n'ihi na ha achọghị ka ndị na-eso Fada Mbaka gbakụta onye ndu ha azụ. si, " Ugbu a nke a bụ ihe na-eri Father Mbaka nri n'afọ."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2

End of X post, 3

End of X post, 4
Cheta na otu APC nọburu taa kwuo na ha ga-agba Mbaka n'anwụ n'aka isiụlọọrụ Ụka Katọlik dị na Vatican.
Osote Odeakwụkwọ pati ahụ bụ Yekini Nabena sị, "Anyị na-akpoku Fada Mbaka ka itinye uchu n'ọrụ ụka hapụ ị na-ekwu okwu ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ya na ya na-eri aṅụ."
Rev Father Ejike Mbaka anaghị ekwuru ụka Katolik n'Enugwu - Enugwu Katolik Diocese
Fada Benjamine Achi bụ odeakwụkwọ ndị Diocese Enugwu gwara BBC Igbo na onye ụkọchukwu bụ Fada Ejike Mbaka anaghị ekwuchitere ụka Katolik n'Enugwu okwu.
O kwuru nke a site n'ịsa okwu Reno Omokri bụbu otu onye ọrụ Goodluck Jonathan bụbu onyeisiala Naịjiria kpokuru ndị isi ụkọ Chukwu ka ha chutuo Fada Mbaka.
Yipunu Fada Mbaka akwa ụkọchukwu - Reno Omokri

Ebe foto si, Reno Omokri, Amen Facebook
Reno Omokri bụbu otu onye ọrụ Goodluck Jonathan bụbu onyeisiala Naịjiria ekwuola na oge eruola mgbe a ga-eyipu Fada Ejike Mbaka akwa ụkọchukwu.
Omokri kwuru nke a dịka Fada Mbaka nke Adoration Ministries kpọrọ oku ka Onyeisiala Muhammadu Buhari (bụ onye Mbaka kwadoburu) rituo n'oche maọbụ ka ndị omeiwu chụpụ ya.
Omokri kwuru na ọ bụrụ na ndị ụka Katọlik eyipughi Mbaka uwe ụkọchukwu, na ọ ga-emebicha aha ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Omokri gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ Mbaka karịa Buhari, bụ onye kwesịrị ịgba arụkwaghịm.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6

End of X post, 7
Omokri rụtụkwara aka n'etu Fada Mbaka sịrị kwadobuo Hope Uzodimma bụ gọvanọ Imo steeti ma tụgharịkwaa sị na ọ kwadoghizi ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 8
Lee ihe ndị ọzọ kwuru maka Fada Mbaka na soshal midia:
Azubuike Chibueze jụrụ ma Chi Fada Mbaka ọ na-atụzị asị, na ọ gwachara ndị Naịjiria na Buhari bụ onye nzọpụta ma pụta ugbua tụgharịa ọnụ ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 9
Ezeamaka kwuru na ọ bụ onye ụka Katọlik mana ihere Fada Mbaka na-emezi ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 10
@Lemonplus1 kwuru na Fada Mbaka na-ebute mgbagwoju anya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 11
Mana Dayọsis ndị ụka Katọlik dị n'Enugwu nke Fada Mbaka nọ n'okpuru ya, ekwuola na Fada Mbaka anaghị ekwuchitere ha, na ọ na-ekwuru onwe ya.
Fada Benjamine Achi bụ onye odeakwụkwọ Bishọp dayọsis ahụ gwara BBC na fada ọbụla na-ekwu okwu na-esighi n'aka Bishọp na-ekwuru onwe ya, na ọ naghị ekwu n'aha ụka Katọlik.
Ọ bụrụ na ndị omeiwu achụpụghị Buhari, ihe dị njọ ga-adakwasị ha niile - Fada Mbaka

Ebe foto si, Adoration Ministry Enugu/Facebook
Ụkọchụkwụ Katọlik bụ Fada Ejike Mbaka ekwuola nsonso a ka onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadụ Buharị sị n'ọchichi pụọ.
O kwuru na ọ bụrụ na Buharị abụghi n'ọchịchị na a ga-ewepụ ya. O kwuru sị " okwu a dị omimi, ọ bụ okwu nke sitere na mụọ".
Ọ kọwara sị "A ma m na ndị mmadụ ga-ajụ m sị 'ọ kwa m kpere ya ekpere', kama ọ na ọbụghị Samuel mere Saul Eze n'akwụkwọ nsọ? " .
Mbaka kwuru sị "Ọ bụrụ na ndị omeiwu achọghị ịchụpụ Buhari, ihe ọjọọ ha na-atụghị anya ya ga-adakwasị ha".
O kwukwara na ndị ọchịchị na-emegbu ndị ha na-achị ma ugbu a. ndị a na-achị ga-emegbu ndị ọchịchị.
O kwuru na Chukwu na-ajụ, "Gịnị ka unu chọrọ? ihe m na-asa ya bụ ka ọ wepụ ndị ọchịchi anyị".
Mbaka kwuru na ụmụnwaanyị na-abanyezi ịgba akwụnakwụna kama enweghị umu nwoke ji ego ịkwụ ha ụgwọ maka ihe isi ike na Naijirịa.
O kwukwara ka ndị ọchịchi ụka ghọta na ọ bụ onye ozi Chineke ma sị ka ndị ọchịchị ụka hapụ iluso ya ọgụ.
Fada Mbaka oge ọkwadoro onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buharị
Ụkọchụkwụ Katọlik bụ Fada Ejike Mbaka etinyela ọnụ n'okwu EndSARS ma sị na ọ bụghị nani n'ọchichi Buharị ka nsogbu mmekpahụ ndị uweojii SARS na nsogbu ndị ọzọ dị na Naijiria bidoro.
O kwuru na ndị chịbụru mbụ so kwa tinye Naịjirịa n'ọnọdu ọjọọ ọ nọ na ya ugbua.
N'ozi o wepụtara n'ọba "Adoration Ministry" nke Facebook,Mbaka kwuru si "Etu a ka ọ dị kemgbe, ọ bụghi Buhari bidoro ya".
Mbaka kọwara na SARS abụghi nsogbu Naijirịa, n'ihi na e wepụ SARS, ihe na-ebe ga-aka na-ebe.
Ọ kọwakwara na e nwere etu SARS si dị mma ma nwee kwa etu ha sịri jọo njọ.
Ma sịkwa na ndị uweoji a akpụ n'ọnụ, na ọ bụ ego ole ka gọọmentị na-akwụ ha?
Mbaka jụrụ sị "Ndị uweojii ole nwereike ịzịga ụmu ha ụlo akwụkwọ".
Ọ rụtụrụ aka na ọ bụ nrụrụaka nke ndị ndọọndọọ ọchịchị butere nsogbu Naijiria nọ na ya.
Ọ jụrụ sị "kedụ etu onye omeiwu ga na- eburu ego ma ndị ntorobịa enweghi ọrụ?"
Mbaka jụrụ na e nwere ego e kwesịri inye ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ nke Onyeisiala Buharị jichiri?
O were sị, 'Ihere ndị ọchịchị anyi na-eme m".
Mbaka ji mba Dubai wee maa atụ were sị, "Dubai bụ ala ịkpa abụrula obodo e ji ama atụ. Kedụ ihe Naijiria ji ego mmanụ agbidi eme kemgbe?"
O kwuru na ọ bụ nanị mmadụ ole na ole na-eri ego Naịjirịa.
O kwukwara sị " nsogbu anyị bụ ndị omeiwu na ndị na-akwado iwu Naijirịa".
Mbaka kpere ekpere sị ka Chineke gozie mmadụ niile na-alụ ọgụ ka Naịjirịa dị mma.
'A ga m ekwu ihe Chineke sị m kwuo' .
N'okwu gbasara nkataọ ọtụtụ na-akatọ ya maka amụma ya, Mbaka dọrọ ndị na-akpo ya ajọ aha maka ihe o kwuru aka na ntị sị ka ha kpachara anya dịka ọ sị na ọ bụ ihe Chineke sị ya kwuo ka ya na-ekwu.
Ọ jụrụ sị " Chineke gwa m onye ka abụ onyeisiala, onye ka m bụ m ga-eji asị na ma gaghi ekwu ya?"
O kwuru na ọ bu Chineke ka ọ ga-erubere isi, na ọ bụghi mmadụ.
Mbaka kwuru na ọ bụ onye amụma Chineke, ma kọwaa sị "anaghị m ataghari ọnụ, ọ bụ ihe Chukwu gwara m ka m na-ekwu".