2019 Elections: Buhari adaghị ntụliaka n'Enugu, edere ya ede - Mbaka
Ụkọchukwu a ma ama bụ Reverend Father Ejike Mbaka, ekwuola na ndị Enugwu kwesịrị idenye Buhari vootu gbagotara n'ọnụọgụgụ karịa oke e nyere ya.
Mbaka boro ebubo na ndị Enugwu ji aka ha denye Buharị ọnụọgụgụ na-ebughi ibu, ma kwuo na obi dị ya ụtọ na Buhari mechara merie na ntuliaka, "ihere wee bụrụ nke ndị iro ya".

Ebe foto si, AMEN/Getty
Mbaka gwara Ayogu Eze sị ya ntọọ, na ọ gwara ya ka ọ ghara ịzọ ntuliaka dịka gọvanọ, mana o geghi ya ntị.

Ebe foto si, Adoration Ministry/ Getty Images
Ọ gwara Ayogu Eze na nnukwu ọnụọgụgụ Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi jiri merie ya kwesịrị ikuziri ya na enwere mbe na abọ nke bụ oke.
Mbaka dọrọ ndị na-akatọ ya aka na ntị ka ha ghara itinye onwe ha na nsogbu nke chukwu.