Imo state: Aga m anabata mkpebi ụlọikpe mgbe m garuru - Uche Nwosu
Uche Nwosu bụ onye a kpọpụtara aha ya dịka onye gbara onye abụọ na ntuliaka gọvanọ Imo steeti, ekwuola na ọ ga-aga ụlọikpe ịzọ mmeri ọ sị kwesịrị irute ya aka.
Ọ gwara BBC Igbo sị na iwu obodo akwadoghi etu Emeka Ihedioha nke PDP si nweta mmeri, makana o nwetazughi vootu pasentị 25 (25%) n'ime okpuruọchịchị 18 n'ime 27 dị n'Imo steeti.
O kwukwara na ọ ga-anabata ihe ọbụla bụ mkpebi ụlọikpe mgbe ọ garuru.
Maka etu ndị na-akwado Ihedioha si na-adọkasị mbadamba e sere ihu ya o ji chụọ nta vootu, Nwosu kwuru sị na ọ gwakwara ndị nke na-akwado ya ka ha ghara iso kpaa ụdịrị agwa ahụ maka aka o binyere n'ime akwụkwọ nkwekọrịta udo "peace accord".
O kwuru na ihe dị mkpa bụ ka udo chịa n'Imo steeti.
Akụkọ ga-amasị gị:
