Emeka Ihedioha: Uche Nwosu ọ ga-aga n'ụlọikpe?

Uche Nwosu

Ebe foto si, Facebook/Nwosu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Akụkọ na-eru anyị na ntị ugbua bụ na Uche Nwosu zọrọ ọkwa ọchịchị n'Imo steeti nwere ike ịga ụlọikpe.

Site n'ihe o kwuru n'elu Facebook ya, Nwosu kwuru na e zupuru ike ọchịchị n'aka ya, ma kwuo sị na ọ ga-anapụta ya; ma kwuo na ọ na-agbado ụkwụ n'ihe iwu obodo kwuru maka usoro e ji akpọpụta onye nwetara mmeri.

O kelekwara ndị Imo na ndị na-akwado ya maka etu ha sị kwụnyere ya n'oge ntuliaka.

Lee ihe o dere ebe a:

Ọ gwakwara BBC Igbo ihe ọ ga-eme maka mkpebi ụlọikpe. Gere ya ebe a:

Aha onyonyo, Aga m anabata mkpebi ụlọikpe mgbe m garuru - Uche Nwosu

Akụkọ ga-amasị gị: