Otu AA nwere ike ịchụpụ Uche Nwosu na pati ha

Ebe foto si, Kenneth Udeze, FCC Jones
Ndị otu Action Allaince(AA) nwere ike ịpịa Uche Nwosu bụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti n'aha pati ahụ ụtari maka ịkwado onyeisiala Muhammadu Buhari.
Onyeisioche otu pati ahụ n'Abuja bụ Kenneth Udeze gwara BBC na Uche Nwosu ikpọ ekwo nku na ịkwado Buhari nwere ike ibutere ya ntaramahụhụ pati ha.
Udeze kọwara na tupu ha enye Nwosu ikike ịzọ gọvanọ Imo n'aha pati ha na otu AA na pati ndị ọzọ nọ na CUPP nwere nwekọrịta ịkwado Atiku maka ọkwa onyeisiala.

Ebe foto si, Kenneth Udeze
O kwuru na inupu isi na-akwado Buhari bụ ịrụnye pati nyere ya ebe mgbaba oge a jụrụ ya ajụ.
Ọ gara n'ihu sị, "AA na-eleba okwu ahụ anya."
"Mgbe kọmitii ọ dịrị inye ntaramahụhụ(disciplinary Committee) nyochachara okwu a ma tunye anyị aro, anyị ga-agwa ọha mkpebi anyị n'okwu ahụ."
Udeze jụrụ sị, "Ọ bụ na ọ bụghị Buhari ị na-akwado bụ onye nọ n'Aso na-ele a nara gị oke ruru gi?"

Ebe foto si, Kissinger Ikokwu
Na ọsịsa ya, Uche Nwosu kwụsiri ike na ya ga-akwado Buhari n'ihi ya nwere ikike site n'iwu ala Naijiria ịkwado onye masịrị ya.
Nwosu, onye kwuru nke a site n'ọnụ na-ekwuchitere ya bụ FCC Jones Onwuasoanya kwuru na AA enweghị ikike ịmanye mmadụ ime ihe amasịghị ya.
Oge BBC jụrụ ya ma ọ ma na pati ahụ na-akwado ịchụpụ ya dịka onye otu ha ma ọ bụrụ na ọ gbanweghị, ọ sara
Cheta na otu AA na ndị APC nwere kwanta n' ọgbakọ achụmta vootu nke pati ha mere n'Owere na izu gara aga.
Ihe na-ese

Uche Nwosu bụ onye ji aha AA azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti dịka ọ hapụrụ APC.
O nwere mkpebi ịgbasa ozi achumnta vootu na-ekwu ka a tụnyere Buhari maka ọkwa onyeisiala.
Ndị ọnụ na-eru n'okwu kwuru na nke a megidere pati ya bụ AA n'ihi n bụ ihe Bekeee kpọọ 'antiparty activities.'
Barr Ifeanyị Ulumba kwuru sị, "Anaghị eji ukwu abụọ awụ okwe. Mmadụ ịnọ na pati na-arụrụ pati ọzọ ọrụ."
Nma Olebara kwuru na agwa ahụ "adịghị mma, sị na mmadụ 'a ghaghị arụọla John Holt ọrụ ga na Allen ga nara ụgwọ ọnwa."
Ha kwuru na agwa ahụ nwere ike ịkpatara ya ntaramahụhụ n'aka pati AA.

Ebe foto si, Uche Nwosu Facebook
Mana onyeisi mgbasaozi achumnta vootu Uche Nwosu bụ FCC Jones Onwuasoanya kwuru n'onweghị ihe ọjọọ dị na ya.
Onwuasoanya sị "Uche Nwosu nwere ikike dika iwu siri kwado onye ọ ga-akwado. O kwuola na ya ga-atụnyere na onye ọ chọkwara ka ndị na-akwadoro ya tụnre bụ Muhammadu Buhari."
Ọ bụghị naanị Uche Nwosu bụ onye nọ n'otu pati na-akwado pati ọzọ.
Nna ya ukwu maburu kwa ọgọ ya nwoke bụ Rochas Okorocha nọ na APC ma na-akwadọ Nwosu nọ n'otu AA.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post








