Aga m etinye ndụ m maka Nwosu ịbụ gọvanọ - Okorocha
Akụkọ kachasị mkpa taa:
Gọvanọ Okorocha aṅụọla iyi

Ebe foto si, BBC Igbo
Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha e forola ntụtụ taa na ọ ga-ekwerịrị ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu n'aka dịka gọvanọ ga-anọchi anya ya.
OKorocha n'oge o duru Odeakwụkwọ gọọmenti Imo State bụ Mark Uchendu na dị ọzọ n'iyi ọrụ kwuru na ọ ga-etinye ndụ ya na ọbara ya iji hụ na o nyere Nwosu ọkwa ọchịchị.
Ụlọomeiwu etinyela anya n'akwụkwọ ntuliaka

Ebe foto si, Nigerian Senate/Facebook
Ụlọomeiwu amalitela ọzọ taa ileba anya n'akwụkwọ nhazigharị ntuliaka bụ nke onyeisiala Muhammadu Buhari jụrụ ibinye aka.
Onyeisioche kọmitii na-ahụ maka ntuliaka bụ Suleiman Nazif kwuru na nke a bụ maka ọ dị mma ndị Naịjirịa.
Akụkọ si mba ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe mbaụwa na-ahụ maka mpụ a maala onye bụbu osote onyeisiala mba DR Congo bụ Jean-Pierre Bemba ikpe ma tụọ ya mkpọrọ otu afọ.
Ụlọikpe a kwuru na o nyere ndị akaebe ngarị n'ikpe a na-ekpe maka mpụ ọ mere n'agha megide mmadụ.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Otu jikọtara ndị ogbu bọọlụ na mba Ghana a machibidola ndị otu ha mmadụ isii ọzọ igbu bọọlụ ka e mechara nyocha iri ngarị.
Otu ahụ machikwara ndị ọrụ asọmpi iri anọ na asaa rue ogologo afọ iri, ebe ha kagburu ebubo eboro ndị ọzọ.
Nkeji Abalịa
Lee ihe nkiri ga-amasị gị taa
BBC Igbo mere njem na mpaghara ọwụwanyanwụ Naịjirịa inyocha ụfọdụ ụzọ ndị gọọmenti etiti kwuru na ha na-arụ ma hụ na onweghị ndị nọ ọrụ n' ụzọ si Owere gawa Port-Harcourt.
Nnamani anatala akwụkwọ mmasị

Ebe foto si, Facebook/Nnamani
Akụkọ anyị na-anụ ugbua bụ na aka chịburu Enugwu steeti bụ Chimaroke Nnamani, anarala akwụkwọ mmasị ịzọ ọchịchị.
Ọ chọrọ ịzọ oche nnọchite Enugwu East n'ụlọomeiwu ukwu, n'okpuru otu PDP.
Idemmiri emeela Kogi steeti ịwa
Aka na-achị Kogi steeti bụ Yahaya Bello, akpọkuola gọomentị etiti ka ọ gbatara ndị steeti ya ọsọ enyemaka maka idemmiri na-enye ha nsogbu.

Ebe foto si, ChannelsTV
O kwuru na idemmiri a metụtara ihe ruru obodo narị abụọ dị n'ime okpuru ọchịchị iri na steeti ahụ, karịrị nke ha hụrụ n'afọ 2012.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Idemmiri eriela ụfọdụ obodo na Kogi steeti
N'akụkọ yiri ya,
Oke ifufe na idemmiri ka na-enye mba Amerịka nsogbu.

Ebe foto si, Reuters
Ebe ọ kwụ ugbua, Ifufe Florence a ataala isi ihe ruru mmadụ iri na asaa, ebe mmiri akwụsịbeghị izo n'ụfọdụ obodo dị na Nọt Karolaịna kamgbe ụbọchị anọ gara aga.
N'egwuregwu,
Otu atọ apụọla n'asọmpi bọọlụ nke Iko Aiteo a na-agba na Naịjirịa.
Ifeanyi Ubah FC buliri iko a n'afọ 2016, Niger Tornadoes buliri ya n'afọ 2017 na Go Round FC, bụ otu ndị a gbapụrụ n'agba mbụ nke asọmpi a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post










