INEC: Anyị chọrọ ego dị ijeri naịra 189 maka ntuliaka 2019

Ebe foto si, Nigerian Senate/Facebook
Ndị ụlọomeiwu na ndị isi ụlọọrụ INEC nwere nzukọ ụnyaahụ n'ịza oku onyeisiala Buhari kpọrọ ha n'itinye aka n'akwụkwọ bọjetị ndị INEC maka ntuliaka afọ 2019.
Ndị kọmitii ụlọomeiwu na-ahụ maka ụlọọrụ INEC gbarụrụ ihu ma jụọ ajụjụ maka ndiiche dị n'akwụkwọ Buhari zitere ha na nke ndị INEC zitere.
Onyeisiala Muhammadu Buhari zigara ndịomeiwu bọjetị dị ijeri naịra 143 ka ha tinye aka na ya ozugbo, ebe ego dị ijeri naịra 43 bụ mgbakwụnye maka ọdịnihu.
Mana onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Mahmood Yakubu, gwara ndị ụlọomeiwu na ọ chọrọ ego dị ijeri naịra 189.207 bụ kpamkpam ego niile ha chọrọ maka ntuliaka afọ 2019.

Ebe foto si, AFP

Ihe a bụ Ụfọdụ ego ole INEC chọrọ na ihe ndị eji ha eme:

Ebe foto si, AFP
- Ijeri naịra 31.49 maka mbipụta akwụkwọ ntuliaka.
- Ijeri naịra 6 maka inye ndị ọrụ nchekwa nri n'oge ntuliaka ahụ.
- Ijeri naịra 134.427 maka iji rụọ ọrụ dị n'ime ntuliaka.
- Ijeri naịra 27.503 maka technụzụ e ji eme ntuliaka.
- Ijeri naịra 22.660 bụ ego maka nhazi ntuliaka ahụ.
- Ijeri naịra 4.614 bụ maka mmefu ndị ọzọ dị iche iche.
- Ijeri naịra 28.549 ịkwụ ndị ọrụ nchere-oge nke Bekee kpọrọ (ad-hoc workers) na ntuliaka.









