Buhari: Ihe Ndigbo na-ekwu maka ya ịzọ ọchịchị ọzọ na 2019

Ndigbo

Ebe foto si, Getty Images

Ebe ụfọdụ ndị Igbo ọnụ na-eru n'okwu na ekwu na okwu aka na-achị Sokoto steeti bụ Aminu Tambuwal kwuru banyere Buhari adabachaghị, ndị ntorobia sị na okwu ya bụ eziokwu.

Nsonso a, Tambuwal kwuru na agbanyeghị na onyeisiala Muhammadu Buhari bụ onye na-akwụba aka ya ọtọ, na nka na ọrịa ga-abụ nsogbu ya ịzọ ọchịchị na 2019.

Tambuwal kwuru nke a oge otu dị icheiche dị na steeti ya gara ya njem nkwado n'obi gọọmenti steeti ahụ.

Gọvanọ ahụ gọrọ na ya abụghị onye iro Buharị kwuru: "Anyị hụrụ onyeisiala Buhari n'anya ma kwenye na ịkwụwa aka ọtọ ya na ezi echiche o nwere maka ala anyị."

Aminu Tambuwal

Ebe foto si, @AWTambuwal

Nkọwa foto, Aminu Tambuwal bụ gọvanọ Sokoto steeti bụbu onye otu PDP tupu o fere APC

"Mana ihe ndị a ezughị. Anyị niile ma maka mmiri n'ehi n'ọchịchị n'ihi ọ kaala nka nakwa ahụ esighị ya ike. Ya mere ụmụ Naijiria ji chọọ ndị na-eto eto dịka ndị ga-edu ala anyị."

Tambuwal boro ebubo na o nwere ndị ọ bụ ha were ike ọchịchị na-arụzị ọrụ dịrị onyeisiala.

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, @bashirahmad

Nkọwa foto, Muhammadu Buhari gara njem ezumike na Lọndọn ihe karịrị abalị 10 gara aga

N'otu aka ahụ ọ kọwapụtara na o nwere ndị na-akwalite ya ka ọ zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019. Ma kwuo na ya ga-ekwupụta ebumnuche ya gbasara nke a n'abalị ole na ole na-abịa.

Mana ụfọdụ ndị Igbo nwere agba na-ekwu na Tambuwal ekwuteghị ya.

N'okwu ya, onye isi otu pati UPP bụ Chekwas Okorie, kwuru na, "Ọ bụ ụmụ Naijiria ka ọ dịrị ikwu onye ga-abụ onyeisiala na 2019, na agbanyeghị afọ maọbụ ọnọdụ ahụike."

Okorie katọrọ Tambuwal maka ihe o kwuru sị na okwu ya (Tambuwal) bụ mere n'ihu, gwọpụtụ n'azụ nke agaghị ewetara ya ezi aha.

Chekwas Okorie

Ebe foto si, UPP/Facebook

N'otu aka ahụ, onyeisi otu Ohaneze n'Abia steeti bụ Ezechi Chukwu kwuru na, "Afọ ekwesịghị ịbụ ihe aga agbanye ụkwụ ma ọbụrụ na onyeisiala nwere ahụ ike ị nọ n'ọkwa ya."

Mana ọ kpọrọ oku ka e nwee atụmatụ ga-eme ya iwu na onye ọbụla chọrọ ịzọ ọchịchị iwepụta akwụkwọ ọnọdụ ahụike ya tupu ọ banye n'ọchịchị.

Ọ sị: "Tupu mmadụ apụta ịzọ ọchịchị, o nwe asambodo na-egosi ọnọdụ ahụike ya."

Ihe ndị ntorobịa Igbo na-ekwu

Mana ụmụ Igbo na-eto eto kwụnyere n'okwu Tambuwal.

Kingzubi Ozumba sị "Nkeca bu eziokwu. Buhari emeela okenye ọ ka mma ka o jee zue ike."

Obiora Godwin kwuru : "Nwa amadi a kwuru nke bụ eziokwu. Buhari akala.

"Ọ bụghị naanị nka, onye oru oyibo ọbụla na-aga ezumike nka mgbe ọ gbara iri afo isii. Kedụzi ka onyeisiala ga-esi na-apụta ịchị ọzọ ebe o gbalara iri afọ asaa na ụma."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị