"Ndị ntorobia nwereike ị họpụta onyeisiala ọhụrụ na 2019" - Onyeisioche Inec

Ndị ụlọọrụ na-eme ntuliaka

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisioche Inec ekwuola na ọ bụ ndị ntorobia nwereike ị họpụta onye ga-abụ onyeisiala na ntuliaka 2019.

O kwuru na nke a ga-eme site n'ọnụọgụgụ ndị bụ ntorobia n'ala Naịjiria ugbua.

"Dịka anyị na-eme ndenye aha maka ntuliaka afọ 2019, ihe anyị hụrụ bụ na ndị ntorobia bụ ndị kachasị n'ọnụọgụgụ ndị denyere aha maka ịtuliaka na 2019".

Aha onyonyo, 2019: E ji Ndigbo eme akaje

O kwukwara na n'agbanyeghi na e nwere otu ndọrọndọrọ ruru 68 ugbua, otu ndị ọzọ ruru 130 etinyela aha ịbụrụ otu ndọrọndọrọ nke ha.

Yakubu kwukwara na kemgbe ebidoro ị denye aha maka ntuliaka 2019 n'ọnwa eprelu nke 2017, mmadụ ruru nde iri n'otu edenyela aha ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: