APC Campaign Council: Ihe mere ndị gọvanọ ha ji gbahapụ mbido nzukọ achụmnta vootu ha

Ebe foto si, Twitter/APC
Ụfọdụ ndị mmadụ nọ na mgbagwojuanya etu ndị gọvanọ ahọpụtara n'otu pati APC ji gbahapụ mbido nzukọ achụmnta vootu nke ha hibere maka ọkwa onyeisiala.
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari, bụkwa onye ji ọkọlọtọ pati ahụ azọghachị ọkwa onyeisiala n'afọ a, kọwara na nhibe a emere bụ iji tụlee ma binye aka n'usoro ehibere iji mee achụmnta vootu ahụ.
Ndị gọvanọ a họpụtara n'otu pati a, bụ ndị enyere isi nlekọta nke otu achụmnta vootu a na steeti ha dị iche iche.
N'okwu ọ gwara BBC Igbo site n'ekwentị ya, ọnụ na-ekwuru otu pati PDP bụ Kola Ologbondiyan, kọwara na nke a na-egosi nkwekọrịta ụmụ Naijiria nwere iji akwụkwọ vootu ha chụtuo ọchịchị Buhari.
O kwuru na ọchịchị Buhari akụọla afọ n'ala n'ihi enweghị ezi ọsịsa banyere ọtụtụ nsogbu ji obodo Naijiria aka ọjọọ.
N'aka nke ọzọ, osote ọnụ na-ekwuru otu pati APC bụ Yekini Nabena, kwuru na ọ bụghị eziokwu na ndị gọvanọ otu pati ahụ gbahapụrụ nzukọ achụmnta vootu ha.
O kwuru na a na-ele anya na ndị gọvanọ otu pati ha ga-agbado anya n'ọrụ ha dịka ndị isi nlekọta otu achụmnta vootu nke pati a na steeti ha dị iche iche.
Atụmatụ a bụ nke ha na-ele anya ga-eme ka otu pati a nweta mmeri na ntụliaka ọkwa onyeisiala a ga-eme n'ọnwa Febrụwarị 2019.
Akụkọ ga-amasị gị:








