#Beyondfakenews: Buhari ariola ndị ntaakụkọ ka ha na-enyocha akụkọ tupu ha ebipụta ya

Ebe foto si, The Presidency
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari akpọọla ndị ọrụ ntaakụkọ oku ka ha na-agba mbọ inyocha ma akụkọ ọ bụ eziokwu tupu ha ezipụ ya iji gbanarị akụkọ ụgha.
Buhari kwuru nke a oge onye isi BBC World Service bụ Jamie Angus gaara ya njem nleta n'obi gọọmenti dị n'Abuja.
Onyeisiala kelere BBC maka ezi aha ha nwere ọkachasị n'oge obodo bụ igwe dịka oge agha Biafra.

Ebe foto si, The Presidency
"Site na itinye uchu n'inyocha akụkọ tupu ha ewepụta ya, BBC nwetara onwe ya aha dịka ụlọakụkọ anaghị ele anya n'ihu nke na ndị mmadụ tụkwasara ya obi."
Ka o si gaa na mkparịtaụka maka akụkọ ụgha
Ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa bịara ọgbakọ BBC mere n'Abuja ụbọchị itoolu nke ọnwa Jenụwarị 2019 maka mkparịtaụka akụkọ ụgha ekwupụtala ụzọ ole na ole a ga-esi kwụsị mgbasa akụkọ ụgha na Naịjirịa.
Osote onyeisiala bụ Yemi Osibanjo kwuru n'ọgbakọ ahụ sị, "Ọ bụrụ na onweghị ihe e mere gbasara akụkọ ụgha, onweghịzị ihe a ga-ekweta na ọ bụ eziokwu n'obodo Naịjirịa".
O kwukwara na ọ ga-adị mma iwepụta iwu ga-achịkwa akara soshal midia.

Ndị ọbịa bịara ọgbakọ a ji ohere a kwupute uche ha gbasara isiokwu a.

Onye nkwuputeọnụ ndị Inec bụ Festus Okoye kwuru na "iwu anyị nwere n'ala Naịjiria ezuola, anyị ekwesịghị ịwepụta iwu ọzọ ga-akpachi nka"

Ebe foto si, BBC Sport
Odeakwụkwọ ama ama bụ Wole Soyinka, kwuru na ọ dị mma inyocha ozi ọbụla ị nụrụ ebe ọ bụla.
N'ọnụ ya, "ọ na-agbagwoju anya na onye chịgoro ọchịchị afọ asatọ ga-ekwu na otu ihe bụ ekwensu ma mecha sị na ihe ahụ bụ ihe enweghị ntụpọ ọbụla."

Uche Pedro nke Bella Naija sokwa na ndị tinyere ọnụ n'okwu kwuru na ndị dị afọ iri anọ, iri ise, iri isii na iri asaa ekwesịghị ịmepụta iwu banyere teknụzụ ndị dị afọ iri abụọ na iri atọ rụpụtara.
Maka na ga-eji ya wee taa ndị mmadụ ahụhụ.

Onyeisi ụlọọrụ BBC world service bụ Jamie Angus, kwuru na ụlọọrụ BBC ga-ewepụta ozi nyocha pụrụiche iche akụkọ ọ bụla pụtaranụ ọkachasị maka ntuliaka na-abịanụ.


Eunice Atuejide bụ onye na azọ ọkwa isi ala kwuru na "enwere ihe dị iche na akụkọ ụgha ya na okwu si n'echiche mmadụ pụta"
Onye ntorobia bịakwara ọgbakọ a kwuru ka gọọmentị etiti kwụsị iji akụkọ ụgha were na-agba akụkọ ụgha mgba.
Onye ntorobịa ọzọ kwuru na gọọmentị kwesịrị ịnwe akara soshal media ka amara onye bụ onye n'eke akụkọ ụgha.
Ihe mere eji ehibee ọgbakọ akụkọ ụgha
Ụbọchị 16 nke ọnwa Febrụwarị bụ ụbọchị dị mkpa na Naịjirịa makana ọ bụ ụbọchị a ga-eme ntuliaka iji họpụta onye ga-abụ onyeisiala nakwa ndị ụlọomeiwu.
BBC Afrịka ga-egosi mmadụ ihe niile gbasara ntuliaka a na Naịjirịa nakwa na gburugburu ụwa site n'elu Redio, ihe nkiri, n'ịntanetị nakwa soshal midia.
Dịka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị malitere ịchụ nta vootu, a ga-enwe akụkọ ozi pụrụiche nke ndị BBC Afrịka ga-esi n'ụlọọrụ BBC News Igbo, BBC News Yoruba, BBC News Hausa, nakwa BBC News Pidgin, wepụta.
Ọ ga-apụtakwa n'asụsụ Bekee na French.
BBC Afrịka hibere ọgbakọ na-enyocha etu akụkọ ụgha na-esi agbasa nakwa etu ọ nwere ike isi metụta ntuliaka 2019.
Emume a akpọrọ "Nigeria 2019: Countering Fake News" mere ụbọchị itoolu nke ọnwa Jenụwarị.
Lee ka o si aga na Facebook:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Akụkọ ụgha ebutela ọtụtụ ọgbaghara ọkachasị nke metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa mmekọrịta ndị mmadụ, nke mere na ụfọdụ ndị mmadụ anaghị eji ike enwe ntụkwasị obi n'elu akụkọ ozi.
Onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo, kwuru ihe bụ isiokwu n'ọgbakọ a.
Adesuwa Onyenokwe bụ onye na-ebiputa akwụkwọ Today's Woman, bụ onye na-ajụjụ ndị na-akpa nkata ajụjụ.
Ndị na-akpa nkata n'ọgbakọ a:
- Mahmood Yakubu bụ onyeisioche otu na-ahụ maka ntuliaka bụ "Independent National Electoral Commission (Inec)"
- Ọkammụta Wole Soyinka, bụ onye nwetara nturuugo Nobel maka edemede
- Jamie Angus, Onyeisi otu BBC World Service Group
- Funke Egbemode, Onyeisi otu ndị ntaakụkọ a kpọrọ Nigerian Guild of Editors nakwa onyeisi ndị ntaakụkọ n'akwụkwọ ozi New Telegraph
- Uche Pedro, Onye nwe BellaNaija
Jamie Angus, bụ onyeisi BBC World Service Group kwuru sị: "BBC News hibere ngalaba na-eme nyocha akụkọ na UK. Maka afọ 2018 m kpebie na mpaghara ụlọọrụ BBC ndị dị n'ofesi agaghị na-ekwu naanị maka akụkọ ụgha.
"Anyị malitere ime nyocha nyerela anyị aka ịghọta ihe na-akpalite "akụkọ ụgha".
Anyị amalitekwala usoro ga-eme ka ndị Afrịka na India nwee ike inye ndị mmadụ akụkọ ziri ezi ma nwetakwa ozi bụ nke ezigbo ya."










