Etu ị ga-esi mee ka ụbụrụ nwa gị na-aghọ nkọ

Ụbụrụ mmadụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụbụrụ nwata na-aka amụtakarị ihe site mgbe a mụrụ ya ruo mgbe ọ dị afọ ise.
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist Igbo

A sị na a zụlite nwata n'ụzọ dị mma dịka ọ na-eto na ọ gaghị esi n'ụzọ ahụ pụọ ma o too.

Ụbụrụ nwata na-aka amụtakarị ihe site na mgbe a mụrụ ya ruo mgbe ọ dị afọ ise.

Iwulite ụbụrụ nwata n'oge a na-enyere nwata ahụ aka n'ịmụta ihe n'ụlọakwụkwọ nakwa na ndụ ya niile..

Ihe nwata mụtara mgbe ọ dị obere (Nkeọma maọbụ nke ọjọọ) ga-enye aka ịhazi etu ụbụrụ ha si eto.

Mpaghara ụbụrụ dị iche iche bụ ihe na-ahụta etu nwata si akpa agwa nke gụnyere ịsụ asụsụ, ịga ije, mmetụta uche, ịmụta ihe dgz.

Ụzọ i nwereike iji wulite ụbụrụ nwa gị

Nyocha ngalaba sciencedaily.com gosiri ọtụtụ ihe ndị nne na nna kwesịrị ime iji kwalite ụbụrụ ụmụ ha.

Nke a gụnyere;

Nye nwa gị ohere igwu egwuregwu na mbara ezi (nwere ahịhịa ndụ)

Ụmụaka na-egwu egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Igwu egwu n'ezi na-enyekwa aka ibelata njirimara ọrịa na-emetụta ụbụrụ a kpọrọ 'Attention-Deficit Hyperactivity Disorder'

Nyocha mahadum Aarhus dị na Denmark mere gosiri na ụmụaka toro na gburugburu ebe nwere ahịhịa ndụ (green space) nwere ohere dị pasentị 55 na ha agaghị enwe ọrịa ụbụrụ ma ha too.

Ya mere o ji dị mkpa ka nne na nna nye nwa ha ohere ka ha gwuo egwuregwu na mbaraezi nwere ahịhịa ndụ.

Nke a ga-enyere nwata ahụ aka ka ọ ghara ichefu ọtụtụ ihe na ndụ ya ruo mgbe ọ ga-eto.

Aha onyonyo, Igbo culture: Egwuregwu ụmụaka Igbo jiri nwee aṅụrị oge gboo.

Igwu egwu n'ezi na-enyekwa aka ibelata njirimara ọrịa na-emetụta ụbụrụ a kpọrọ 'Attention-Deficit Hyperactivity Disorder' (ADHD).

Ụdị egwuregwu ụbụrụ nwata chọrọ karịa bụ ụdị egwuregwu na-enweghi usoro nke a na-egwu na mbara ezi.

Ụdị egwuregwu ndị a gụnyere nke egwuregwu aja, nke ime ọhịa, ịkpa nkụ, egwuregwu n'ahịhịa.

Gị na nwa gị nwee mmekọrịta

Nne na nwa ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ị gwa nwa gị okwu, ịgụrụ ya egwu, ijide ya n'aka nakwa ịkpara ya nkata bụ ohere dị mma ụmụaka iji mụta ihe.

Nke a bụ nke kachasị mkpa n'iwulite ụbụrụ nakwa echiche nwa gị maka na ihe ọ chọrọ bụ igosi ya ịhụnanya pụrụiche si n'aka nne na nna.

Dịka ndị e kere eke, mmekọrịta bụ ihe mburu pụta ụwa.

Nyocha a kpọrọ 'Harvard Life Style' kwuru na mmekọrịta mmadụ na ibe ya na-ewulite ahụike na aṅụrị nke ndụ.

Ndị ngalaba ọmụmụ ihe 'Psychologist' tụrụ ilu sị " ọ bụ gị bụ ihe egwuregwu kachasị mma nye nwa gị".

Ị gwa nwa gị okwu, ịgụrụ ya egwu, ijide ya n'aka nakwa ịkpara ya nkata bụ ohere dị mma ụmụaka iji mụta ihe.

E chefukwala na iso bụrụ otu n'ime ngalaba ndụ nwa gị, ọ ga-amụta ọtụtụ ihe site n'ịnọ gị nso.

Belata aka n'ohere ha nwere n'ikiri ihe onyonyo (TV)

Na-agbanyeghi na nwata nwereike ịmụta ihe site na Tekịnụzụ, nyocha gosiri na ọ na-emetụta echiche nwata.

Ọ dị mma na i belatara ohere i nyere nwa gị ka ọ na-ekiri ihe tekịnụzụ nakwa ụdịrị ihe ndị ọ na-ekiri, maka ọ na-egbu ụbụrụ ha ị na-amụta ihe ndị ọzọ dị mkpa.

Kedụ etu dị mma iji kuziere nwata ihe?

Ụmụaka na-amụ ihe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụaka na-amụta ihe karịa mgbe e ji ihe ha na-ahụ n'anya maara ha atụ.

Onye ọkachamara na mmụta ụmụaka bụ Ngozi Orji kwuru na nwata na-amụta ihe site na nke ọ maara gawa na nke ọ na-amaghị.

Na nke a mere onye nkuzi ji ebido n'ihe ụmụaka maara akuziri ha ihe ha ana-amaghị.

Ọ sị na ụfọdụ ụmụaka na-esi n'egwuregwua mụta ihe, ụfọdụ na-esi na foto, ebe ụfọdụ na-amụta n'aka onye ha na-elekwasị anya.

Ọ sị na ọ dịghị mma ịpịa nwata ụtalị dịka ị na-akuziri ha ihe, na ụfọdụ na-amụta ọsịsọ ebe ụfọdụ na-eji nwayọọ amụta kama na onweghi nwata bụ itibọrịbọ.

A bịa n'ịgụ akwụkwọ na ụmụaka na-aka echeta ihe edere n'akwụkwọ karịa nke e dere n'igwe kọmputa maọbụ ihe onyonyo.

Orji sị na ha mụọ ihe ọtụtụ oge na ọ na-aba ha n'ụbụrụ karịa nke ha lere n'ihe onyonyo.

Ọ gara n'ihu kwuo na ụmụaka na-amụta ihe karịa mgbe e ji ihe a na-ahụ n'anya maara ha atụ.

Kedụ ụdị nri ga-enye aka wulite ụbụrụ nwata?

Otu onye ọkachamara na nri (Nutritionist) bụ Amaka Ezeoke sị na nne na nna kwesịrị ị na-enye ụmụaka ha nrị dị gụnyere;

Azụ, akụ na mkpụrụosisi: Ha nwere abụba dị mma na-enyere ụbụrụ aka ịrụ ọrụ ọfụma.

Akwụkwọ nri: Ha nwere akụrụngwa a na-akpọ 'folate' na ' vitamins' na-enyeka ibelata ọrịa nchefu a kpọrọ 'dimensia' na nka.

Nri ndị nwere fibre: Ụdị nri ndị a na-enye aka ịsachasị akwara obi nakwa nke ụbụrụ.