Mbaka: Fada Cajetan abụghịzị enyi Adoration Ministry n'ihi mkparịtaụka BBC Igbo

Ebe foto si, Adoration Ministries Enugu
Ọnụ na-ekwuru Adoration Ministry n'Enugwu bụ Maximus Ugwuoke agọọla na awakpoghị ndị ntaakụkọ BBC n'ogige ụbọchị Wenezde.
BBC kwuburu na ụmụnwoke dị iri abụọ wakporo ha n'ihu Fada Mbaka, ka ya bụ Fada ji aka ya na-adụ ya aka n'ọnụ ma na-akpọ ya aha ọjọọ.
Fada Obiekezie bụ onye dubara ha ịgba Fada Mbaka ajụjụọnụ.
Maazị Ugwuoke n'okwu ya sị na akụkọ mwakpo a bụ akụkọ "nkata a kpara iji mechu aha Fada Ejike Mbaka ma meekwa ka ndị mmadụ na-asọpụrụ ma na-ahụ n'anya."
N'ime akwụkwọ mgbasaozi o binyere aka, Ugwuoke dere na Fada Obiekezie abụghị enyi Adoration Ministrị maka ajụjụọnụ ndị BBC Igbo gbara ya.
Cheta na ụkọchụkwụ ụka Katọlik n'Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka na ndị ọrụ ya kụrụ ndị ntaakụkọ BBC Igbo mmadụ abụọ nakwa ọkwọụgbọala ha ihe tinka kụrụ pan ma nara ha ekwentị ha na ngwaọrụ ntaakụkọ ha n'ogige Adoroation Mbaka n'Enugwu.
Etu Mbaka na ndị na-eso ya siri wakpoo ndị ntaakụkọ BBC n'Enugwu
Obianinwa, Agbanelo na ụkọchukwu du ha bụ Rev Fr Cajetan Obiekezie gara n'ogige 'Adoration Ministry Enugwu' ịgba Mbaka ajụjụọnụ oge a wakporo ha.
Ndị ọzọ so gaa njem a bụ Ndubuisi Nwafor, bu ọkwọụgbọala nakwa onye enyemaka Fada Obiekezie bụ Solomon Orakam.
Ọ bụ n'elekere iri nke ụtụtụ ka ndị ruru ụlọ ụka Mbaka.
Dịka Obianinwa bụ onye ntaakụkọ anyị duru ndị ọzọ gaa ya bụ ije si kọwaa, "nke a mere dịka ha chere Mbaka ihe ruru awa atọ."
"Ọ bụ n'elekere ise nke ehihe ka ha niile si ụlọụka ahụ gawa be Mbaka ịgba ya ajụjụ ọnụ a."
Obianinwa sịrị: "Anyị bịara ịgba Fada Mbaka ajụjụ ọnụ n'Adọration (oge ekpere na-aga), mana ọ gwara anyị ka anyị gaa n'ụlọ ya nke dịkwa n'ogige ahụ chere ya.
"Anyị chere ọtụtụ awa tupu ya abịakwụte anyị, ma gbanwe, bido na-egosi iwe, sị na anyị dere akụkọ ọjọọ banyere ya."
"Fada Mbaka nyere ndị okorobịa ya iwu ka ha nara anyị igwe e ji ese onyonyo na ekwenti anyị ma tie anyị ihe."
Obianinwa siri na ndị a Mbaka kpọtara yiri ha egwu ma sị na ha ga-egbu ha maka ide akụkọ megidere Mbaka.
Onye ntaakụkọ BBC sị na oge ndị a na-aba mba, Mbaka na Obiekezie si n'ime ụlọ ebe ha nọ pụta were tụwa ya aka n'ihu na-akpọ ya "satanic".
Ọ sị: "Ọ bụ mba Mbaka na-aba mere ka ndị okorobịa malite bawa oke mba ma majawa ha.
"Ha sepuru "wig" m kpu n'isi ma tọdo Agbanelo n'olu. Fada Obiekezie bịara isi ka ha kwụsị mana ha wakporo ya ma nara ya ekwenti ya."
Obianinwa sị na ọ bụ oge ya malitere iti mkpu na "ụwa ga-anụ na ọ bn̄ụ na be Mbaka ka egburu ndị ntaakụkọ BBC" ka mwakpo a kwụsịrị.
Obianinwa sị: " Ọ bụ ugbua ka Mbaka sị ka anyị pụọ tupu ndị otu ya egbuo anyị. Ọ gwara ha nye anyị ngwa ọrụ anyị. Ha chụpụrụ anyị n'ebe ahụ. Ndị otu ya so anyị n'azụ ruo oge anyị hapụrụ Enugu ịchọ ọgwụgwọ na enyemaka ndị uweojii."
Ha mechara nyeghachi ha igwe onyonyo ahụ na ekwentị ma dupụ ha n'ogige ha dị n'Emene.
Fr Obiekezie kwukwara otu ihe ahụ. Ọ gwara BBC Igbo na ya gara gwa Fada Mbaka isi ije ndị BBC. Ọ sị na Mbaka kwere nkwa na ọ ga-aza ha ma o mecha adọration mana ọ tụgharịrị gosiwa ha iwe."
Fr Obiekezie, sị na ya bụ enyi Mbaka, na BBC Igbo nweburu mkparịtaụka ebe ọ katọrọ Mbaka maka ụfọdụ okwu ndọọndọọ ọchịchị ọ na-etinye ọnụ na ya, nke o kwuru na o kwesịghị ekwesị.
Father Mbaka bụ ụkọchụkwụ ụka Katọlịk a ma ama na Naijiria maka amụma ọ mara tupu Ntuliaka 2015 na Muhammadu Buhari ga-emeri aka na-chị Naijiria oge ahụ bụ Goodluck Jonathan.
Maazị Ugwuoke sị na Mbaka Adoration Ministry akpọghị BBC ịbịa ịgba Mbaka ajụjụ ọnụ; mana ndị ntaakụkọ BBC sị na onye du ha gaa ebe ahụ gwara Mbaka na ha na-abịa.
Akwọkwọ mgbasaozi o wepụtara sị na ndị BBC batara ka ndị amaghị ndi ha bụ ma na-esi onyonyo na nzuzo, mana ndị ntaakụkọ BBC kwụsịrị ike na ha emeghi etu a ma ncha.
Akwụkwọ ahụ sịka na Fada Obiekezie bụ bụ onye ya na Adoration Ministry adịghị na mma naka mkparịtaụka ya na BBC mere.














