Ụdị nri ise nwereike ịkwalite ọmụmụ na nwoke

Ọmụmụ bụ otu ihe dị oke mkpa n'ịgbatị oge na ndụ ihe e kere eke n'ụwa.
Eke kere ụwa kere mmadụ ma nye ya ikike ọmụmụ nke pụtara na onye ọbụla (nwoke maọbụ nwaanyị) nwere onyinye ọmụmụ.
Mana otu ihe maọbụ nke ọzọ nwereike imetụta ọmụmụ ọkachasị nke nwoke, mana e nwekwara nri ndị ga-enye aka ịkwalite ya.
Otu dọkịta na-ahụ maka nnyocha ahụ mmadụ bụ Ugo Ezenyirioha sị na ụfọdụ nri ndị dịka azụ, mkpụrụosisi, mkpụrụ ụgụ, anụ, akwa na ndị ọzọ na-akwalite uhe (sperm) nwoke.
Ka anyị tulee ụfọdụ ihe nri ndị a bu nwereike ịkwalite ọmụmụ nwoke.
Azụ

Ụfọdụ azụ nwere akụrụngwa a na-akpọ 'Omega 3 fatty acids' nke na-enye aka na ime ka ọbara na-eru na mkpụrụ amụ nwoke nke ọma.
Nnyocha egosikwala na Omega 3 na-enyekwa aka ime ka ọnọdụ uhe nwoke kawanye mma
Mkpụrụosisi

Ebe foto si, Getty Images
Mkpụrụosisi ndị dịka unere, karọt, oroma, beris na ndị ọzọ na-arụkwa ọrụ n'iwulite ọmụmụ na nwoke.
Unere (banana) jupụtara na vitamin B1, C, magnesium na bromelain bụ ndị na-arụ ọrụ n'ọmụmụ nwoke.
Karọt nwere beta-carotene nke na-echekwa ndụ uhe megide 'free radicals nwereike igbu ya.
Oroma nwekwara vitamin C
Akwụkwọ nri na-acha ndụ ndụ

Akwụkwọ nrị na-acha ndụndụ nwere ihe a na-akpọ 'folate'.
Akụrụngwa a na-enyere ụmụnwaanyị aka ịtụrụ ime, ma na-enyekwa aka ichekwa uhe (sperm) nwoke.
Iji maa atụ, mkpụrụ ụgụ jupụtara n'akụrụngwa ndị dịka antioxidants, phytosterols na amino acid na-enye aka iwulite ọmụmụ nwoke.
Ọ na-enyekwa aka ịgbalite ọnụọgụgụ uhe (sperm count), nakwa njem uhe n'ahụ nwoke.
Akwa

Akwa bụ otu n'ihe nri nwere ezi mgbọrọgwụ na mmepụta uhe n'ahụ nwoke.
O nwere vitamin E, zinc na protein b ụ ndị na-enye aka ka uhe nwee ike gazuo ebe o kwesịrị n'ahụ nwoke.
Akwa nwereike ichekwa uhe megide 'free radicals' nke mere ka ohere ọmụmụ na nwoke dị elu.
Tomato

Ebe foto si, Getty Images
Tomato bụ kwa nri ọzọ na-agbali ọmụmụ na nwoke.
Ha nwere akụrụ ngwa a kpọrọ lycopene bụ antioxidant na-akwalite ụdịdị na etu uhe ji arụ ọrụ.
Ị na-eri tomato kwa mgbe na-ewulite ọmụmụ n'ahụ nwoke.
Anụ

Anụ ọbara ọbara a kpọrọ 'red meat' na bekee nwere ọtụtụ uru nwekwaa ọghọm.
Otu uru dị na ya bụ na ha nwere akụrụngwa ndị dịka zinc , folic acid na selenium bụ ndị na-enye aka iwulite uhe dị nwoke n'ahụ nakwa ọmụmụ.
Mana ọ dịghị mma iri anụ ndị a ebe o buru ibu ruo ogologo oge, maka na ha nwekwara oke abụba nke nwere ike ime ka 'cholestrol' dị mmadụ n'ahụ gbalie.
Ihe ọtịta a kpọrọ 'nuts'

Ebe foto si, Instagram/Utakaegbe
Dọkịta Ezenyirioha gara n'ihu kwuo na ihe ọtịta nke Bekee kpọrọ 'nuts' na-enyekwara nwoke aka.
Ha gụnyere: Akị awụsa (tiger nuts), akị oyibo, Walnut, 'datenuts', dịrị gawazie.
Garlic na nri ndị ọzọ nwere Vitamin C, E, B12, D-aspartic na Zinc na-enye aka iwulite uhe.
Ọ sị na ndị ọrụ ahụike na-enye ndị ọnụọgụgụ uhe dị ala ndụmọdụ ka ha na-eri ụdị nri ndị a.










