Vitamin D na uru ọbara n'ime ka ọkpụkpụ sie ike n'ahụ mmadụ

Onye na-anya anwụ

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist Igbo

Ahụ mmadụ nwere akụrụngwa dị iche iche na-enyere ya aka ịrụ ọrụ nke ọma ma gbochie ụfọdụ ọrịa dị aṅaa.

Akụrụngwa ndị a gụnyere ọtụtụ vitamin nke vitamin D so n'otu n'ime ha.

Gịnị bụ Vitamin D?

Vitamin D bụ akụrụngwa ndị ahụ mmadụ chọrọ n'ebe ọ dị obere iji rụọ ọrụ ọfụma ma kwalite ndụ.

Vitamin D dịka aha ya si dị abụchaghị Vitamin kama ọ bụ akụrụngwa na-enye aka n'imepụta 'homonu dị n'ahụ mmadụ.

Kedụ ebe e si enwete vitamin D?

Mkpụrụosisi, ime akwa na mmiri ara ehi

Ebe foto si, Getty Images

Onye dọkịta na-ahụ maka nyocha bụ Chris Ohakpolamugwo sị ndị mmadụ na-eche na ọ bụ anwụ n'enye vitamin D n'ahụ na nke bụ asị

Ọ sị na "eziokwu bụ na anwụ anaghị enye vitamin D kama na anwụ na-enye aka ịmịpụta ya n'ahụ mmadụ.

O kwuru na ụzọ kachasị mma iji mịpụta vitamin D n'ahụ mmadụ bụ site n'ịnwa anwụ nke ọma ọkachasị anwụ ụtụtụ.

Ebe ọzọ e si enwete bụ site n'iri ụfọ nri ndị pụrụiche ọkachasị ndị na-enye 'calcuim' gụnyere;

  • Azụ nwere abụba dịka salmon, mackerel na tuna
  • Nkochi ime akwa
  • Chiiz
  • Imeju anụ
  • Ero
  • Mmiri ara ehi
  • Sịrịlụ na mmanya mkpụrụosisi dgz.

Uru vitamin D baara n'ahụ mmadụ

Ọkpụkpụ ahụ mmadụ

Ebe foto si, Getty Images

Vitamin D na-arụ ọrụ buru ibu n'ahụ mmadụ nke gụnyere ime ka ọkpụkpụ na eze gbasie ike, ichekwa ahụ megide nje ịbata na ihe ndị ọzọ.

kpụkpụ na eze gbasie ike

Vitamin D na-achịkwa 'calcium' na phosporus dị n'ọbara nke na-enyeaka ka ọkpụkpụ ahụ gbasie ike.

Ibuso ọrịa agha

Etu nje coronavirus dị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Eserese nje coronavirus

Nyocha ndị ahụike mere bụ nke e nyochagharịrị n'afọ 2018 gosiri na vitamin D na-enyeka ibuso ọrịa dịka influenza agha.

Nyocha ọzọ e mere na nso nso a gosikwara na ọtụtụ ndị na-ebute ọrịa coronavirus kachasị na ndị vitamin D kọrọ n'ahụ.

Nke a pụtara na otu ụzọ maọbụ nke ọzọ, vitamin D na-enyeaka ibu agha megide ọrịa coronavirus nakwa ọrịa iku ume ndị ọzọ.

Nyocha ka na-aga n'ihu ịmata kpọmkwem etu vitamin na-eji ebuso coronavirus agha, mana ndị ọrụ ahụike enyela ndụmọdụ ka a na-aṅụ akụrụnbwa vitamin D ọkachasị n'oge oyi.

Vitamin D na-enyekwa aka iwulite ahụike ụmụaka a mụrụ ọhụrụ site n'ime ka ha too ọfụma ma gbasie ike dịka ngalaba ahụike ụmụaka nke mahadum John Hopkins si depụta ya.

Ime ka nwaanyị dị ime gbasie ike: Ozi si n'aka otu ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) sị na ọ dị mma ka nwaanyị dị ime inwe vitamin zuruoke n'ahụ ya.

Ime afọ nwaanyị dị ime

Ebe foto si, Getty Images

Ha sị na ọ na-enye aka ịmụ nwa buru ebu ma gbasie ike, ma gbochiekwa ịmụ nwa na-akaghị aka mgbe oge ya erubeghi.

Mana ha dọrọ aka na ntị ka a kpachapụ anya etu e si aṅụ ọgwụ ndị na-enye vitamin D maka ọghọm dị na ya.

Ihe enweghi vitamin D n'ahụ nwereike ibute

Mkpụrụ ọgwụ na-enye Vitamin D

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nyocha gosiri na ọtụtụ ndị bu coronavirus kachasị na ndị na-enweghi vitamin zuru oke

Ọ bụ eziokwu na ahụ mmadụ na-amịpụta vitamin D mana mgbe ụfọdụ ọ naghị ezu oke.

Ihe nwereike ịkpata ezughi oke a gụnyere ụdị anụ ahụ mmadụ nwere, mmadụ ịnọkaarị n'ebe anwụ na-adịghị acha, mpaghara ụwa mmadụ bi nakwa etu e si chee nwata ara.

E nweghi vitamin D n'ahụ nwereike ibute;

  • Ịrịa ọrịa kwa mgbe kwa mgbe.
  • Ike ọgwụgwụ, ọkpụkpụ na azụ mgbu.
  • Mmerụ ahụ alaghịala.
  • Ntụtụisi ị na-adapụ adapụ.
  • Akwara mgbu.

Igbo tụrụ ilu sị na 'imebiga ihe oke adịghị mma', n'otu aka hụ ndị ọrụ ahụike sị na ọ bụ eziokwu na vitamin D dị mma n'ahụ mana ọ dịghị ka karịa n'ahụ mmadụ.

Ọ bụrụ na ọ karịa, o nwereike ibute ọkpụkpụ, akwara, nakwa ihe ndị isi ike nke ga-egbochi ọbara agazughi n'ahụ ka o kwesịrị.