Seasonal Fruits: Mkpụrụosisi ndị ị ga-eji tụọ ndụ gị mmanụ ugbua

Ụdara na ube mgba

Mkpụrụosisi bụ ihe mmadụ nwere ike iji tagharịa ọnụ maọbụ werekwa mere nri na-eju afọ.

Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-ewere mkpụrụosisi mepụta ihe ọṅụṅụ nke Bekee na-akpọ "juice" nakwa nke a kwọrọ akwọ a na-akpọ "smoothie".

Mana otu ihe ị ga-ama maka mkpụrụosisi bụ na ọ na-enwe oge, dịka otu ilu ndị Igbo na-ekwu na "ụkwa ruo oge ya ọ daa".

Etu a ka o si abụ ma oge mkpụrụosisi ruo; mgbe ahụ ka ọ na-aka acha ọfụma na-ekpughị ya akwa makwa kacha tọọ ụtọ.

Mkpụrụosisi ndị nke oge ha bụ ebe ọnwa Disemba na Jenụwarị

1) Ụdara:

Ụdara abụghị mkpụrụosisi ị ga-emetụ ọnụ ma ọ bụrụ na ọ bụghị oge ya, makana ọ ga-adị gị ka ebe e ji akantị marichaa gị anya.

Ọ na-aka mma ma ọ bụrụ na mmiri amatụla ya obere, maọbụ na o ji aka ya dapụ n'osisi kama ịghọtu ya tupu ị rachaa ya, mana ọ bụghị oge niile ka ọ na-eche mmiri tupu ọ tọọ ụtọ.

Ụdara

Nke na-atọ ụtọ, a na-akpọ ya "ụdara nwannu".

Ọ bụ mkpụrụosisi nwere egwu nke ya (ị ga-asị na ị maghị egwu "ụdara m too...ụdara m chaa, ụdara m daa...).

Ihe ọ na-enye n'ahụ:

  • Ọ na-enye kalshịọm nke na-adị mma n'ọkpụkpụ nakwa eze.
  • Ọ na-enye Vaịtamin C nakwa A.
  • Ọ dị mma ịracha ya makana ọ naghị ebu mmadụ ibu.
  • Ndị agadị (nwaanyị dị ime) anaghị eji ya egwu egwu

2) Akị awụsa:

N'agbanyeghị na akị awụsa na-epu n'Ugwu Awụsa, ọtụtụ ndị Igbo anaghị eji ya egwu egwu maka ụdịrị ụtọ ọ na-atọ.

A na-ata ya ka ụkwa achị n'aka, (makana a na-enwe nke kpọrọ akpọ na nke dị ndụ) mana ọ na-aka mma ibanye nke ịkpọ ahụ na mmiri ọkụ ka ọ kwe ọtịta.

Akị awụsa

Ebe foto si, Instagram/Utakaegbe

A na-akwọ ya akwọ eji emepụta ihe a na-akpọ "mmiri akị awụsa" maọbụ "tigernut milk" na Bekee.

Ihe ọ na-enye n'ahụ:

  • Ndị ọkachamara n'ahụike na-ekwu na ọ na-enye aka akwalite agụụ mmekọrịta ahụ nwoke na nwaanyị
  • Makana o nwere nnukwu ihe Bekee na-akpọ "fiber", ọ na-enye aka ime ka ịga mposi ghara ịra ahụ
  • Ọ na-enye aka ịkutu shuga dị n'ọbara

3) Ube mgba/ube okpoko/Ube Okwe:

Ube mgba nke ndị Ugwu na-akpọ "atịlị" yiri ube nkịtị ahụ e ji ata ọka, mana o pekarịrị ya na mpe. Ọ na-ahakwa mmanụ karịa ube igbo.

Ebe mkpụrụ ube igbo anaghị ara ahụ agbawa, a na-ejinwu mkpụrụ ube mgba azụ nchọrọ.

Ube mgba

A na-esi ya n'ọkụ ka o ruo tupu a rachawa ya. Ụfọdụ na-etinye ya nnu tupu ha arachaa ya, mana ị ga-arachanwu ya etu ahụ.

Ọtụtụ ndị amaghị nke a, mana a ga-ejinwu mmanụ pụtara na ya esi nri, nke ndị ma maka ya na-ekwu na ọ ka mmanụ e ji esi nri mma ma a bịa n'ihe ọ na-enye n'ahụ nakwa ụtọ ọ na-enye nri.

Ihe ọ na-enye n'ahụ:

  • Ndị ọnụ na-eru n'okwu maka mmanụ kwuru na mmanụ si na ya na-agwọnwu ọnya n'ahụ mmadụ
  • Mmanụ ya na-adị mma n'izụ ntutu isi
  • Ọ na-adịkwa mma n'anụ ahụ

4) Okpete:

Ọtụtụ ndị na-esi na ya ewepụta shuga ha na-aṅụ karịa nke arụpụtara arụpụta.

Ọ na-atọ bịrịbịrị nke ukwu, mere ndị Bekee ji akpọ ya "sugar cane".

Okpete

A bịa na Naịjirịa, ọ na-epukarị n'Ugwu Awụsa.

A na-ebu ụzọ akpụchapụ azụ ya tupu a taa ya.

Ihe ọ na-enye n'ahụ:

  • Otu dọkịnta gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ na-enye 'Glucose' na-ahụ.
  • O kwukwara na nke na-enye nje dị n'ime ahụ ike ọrụ.
  • Ọ na-enye anụ ime ahụ mmiri.
  • O kwuru na ịta okpete ka mma karịa iri shụga arụpụtara maka ndị na-asọ shuga.

Dọkịnta Ikenna Emedike kwukwara na ọ dị mma ka ndị mmadụ na-eri mkpụrụosisi ndị a mgbe ọ bụ oge ha iji gbalahụ irite nje.

O kwukwara na ọ bụ oge mkpụrụosisi dị n'oge ya ka ọ na-aka enye ihe n'ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: