Mụta etu ị ga esi sie ofe ọha ga-eme ka ị rachaa aka gị

Ofe ọha

Ebe foto si, Chisom Ihenacho

Nkọwa foto, Ofe ọha so na nri ndị Igbo na-ejighị egwu egwu

Ụfọdụ ndị Igbo kwenyere na ọ bụrụ na Ị bụ onye Igbo ma Ị ribeghị ofe ọha, ị maghị ihe na-atụ ndụ mmanụ.

Maka na Igbo nwere olumba dị icheiche, ụfọdụ na-akpọ ya 'ọha' ebe ndị ọzọ na-akpọ ya 'ọra'.

Ọha bụ akwụkwọ osisi ọha. A na-egbuji maọbụ bejiri ya karịa ịkpata ya n'ọhịa.

Ọha na-enwe 'oge', ọ na-apụtakarị n'oge ọkọchị. Mgbe ahụ ka ị ga-enweta nke ahụ dị mma ọfụma.

Ị na-eri ofe ọha tọrọ ụtọ mana ị maghị etu esi esi ya? Nke abụ ohere gị iji amụta ya.

Ngwanri e ji esi ya

  • Akwụkwọ ọha
  • Ede ofe maọbụ ede ụrị
  • Mmanụ nri/mmiri akwụ
  • Anụ dị iche iche (isi anụ ehi na-amasị ọtụtụ ndị mmadụ)
  • Azụ ọkpọọ
  • Okporoko
  • Ose
  • Ogiri Igbo
  • Ịsha
  • Ụzịza (ma mkpụrụ ya na akwụkwọ ya)
  • Magị
  • Ụfọdụ na-etinye ịsam ebe ndị ọzọ na-etinye ero nakwa eju
Akwụkwọ ọha
Nkọwa foto, Ọha anaghị amị oge ọbụla, ya mere o ji amasị ndị mmadụ iri ya oge ọ ka dị mma ọfụma

Kwado ihe ndị ị ga-eji esi ya:

  • Kpaa akwụkwọ ọha gị, tụchaa ya ma sakwa ya mmiri (anaghị eji mma ebi akwụkwọ ọha maka ịchagharị)
  • Sie ede gị, o ghee, sụọ ya n'ikwe. (ọ bụrụ ede akwọrọ akwọ ka ị chọrọ iji esi ya, tinye ole ga-ezu gị n'ime mmiri ma mekọta ya ọnụ ruo oge o bidoro ịlọ alọ)
  • Kpaa akwụkwọ ụzịza gị ma bie ya ebi
  • Kwọọ mkpụrụ ụzịza gị
  • Sachaa nakwa situ ero, eju nakwa/maọbụ ịsam gị n'ọkụ nwaọbere oge
  • Sachaa ma sie mkpụrụ akwụ gị ma ọ bụrụ na ị chọrọ iji ya karịa iji mmanụ
  • Sụpụta ya mmanụ/mmiri akwụ
Ede Igbo
Nkọwa foto, Enwere ede ụrị nakwa ede ofe

Etu esi esi ya

Ọ na-adị mkpa ịkwụ aka gị tupu ị metụ ihe nri ọbụla aka, ya mere anyị ga-eji asị gị kwụọ aka gị ọfụma.

Ihe ndị a ka ị ga-eme tupu isie ọha gị:

  • Sachaa ma sinye anụ gị n'ọkụ, tinyekwa okporoko ka o nwee ike ghee, tinye ya nnu na maggị, o ghewe, wụnye ya mmiri ole ga-ezuru gị mmiri ofe
  • Tinye ose nakwa ịsha akwọrọ akwọ
  • Tinye azụ ọkpọọ nke ị gbawachara agbawa
  • Hapụ ya ka ọ sụkọta ọnụ
  • Tinye mmanụ nri/mmiri akwụ
  • Tinye ede asụrụ asụ n'ọkpụ n'ọkpụ, nke a ga-eme ka ofe gị nwee ike rọọ arọ ọfụma
  • Tinye ogiri, hapụ ya ka ọ gbazee n'ime ite ofe
  • Wunye akwụkwọ ọha gị nakwa akwụkwọ ụzịza
  • Kpagharịa ofe gị, tinye ya nnu etu o si tụ gị n'ọnụ
  • Wunye ya ero, eju nakwa/maọbụ ịsam
  • Hapụ ya ka ọ sikwuo ọbere tupu ị fọtuo ya n'ọkụ
Mkpụrụ akwụ
Nkọwa foto, Ụfọdụ na-eji mkpụrụ akwụ esi ofe ọha kama iji mmanụ nri azụtara n'ahịa

Ihe ndị e ji eri ofe ọha

Ụfọdụ ndị Igbo kwenyere na ọ bụ akpụ a sụrụ asụ kacha mma iji elofe ofe niile.

Kama e nwere ihe ndị ọzọ eji elofe nri dịka:

  • Garị emere eme
  • Ụtara ji
  • Nke ndị bekee kpọrọ semovita
  • Nakwa nke bekee kpọrọ wheat

Ị mụtala etu I ga-esi esi ofe ọha gị ugbua?