Onye hụrụ ube rachawa ya, anaghị ahụ ụbe kwa daa

Kedụ ebe i so; i so na ndị na ndị na-ara ube ara ka i so na ndị na-aracha ya aracha?
Ube bụ mkpụrụ osisi Chineke nyere ndị Afrịka.
Dịka ihe nile nwere oge, oge ube bụ onwa Juun rue ngwucha ọnwa Sepụtemba kwa afọ.
Osisi ube na-eji ihe ruru ọnwa abụọ na ise amị okooko (flower) ya.
Ube na-atọchị ntị ma e jiri ọka taa ya

Mgbe nke a mechere, ọ na-amalite ịmị mkpụrụ ya na mbido udummiri.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụta ube ka mkpụrụosisi e ji emegharị ọnụ mana n'ezie, ube karịrị nke a.
Ube na-enye ọtụtụ ihe na-edozi ahụ ma na-enyekwa ahụ ihe.
Ya kpatara o ji dị mkpa ịracha ube nke ọma n'oge ya.

Gịnị ka ube na-enye n'ahụ?
- Ube na-agbacha ọnụ ma na-ewepụkwa ọnụisi. O nwere akụrụngwa na-egbu nje na-ebute ọnụisi.
- Ube nwere 'vitamin C na E' bụ nke na-enye aka igbochi ọrịa kansa. 'Vitamin' ndị a na-enyekwa aka ime ka anụ ahụ mmadụ na-amụke amụke ma chụkwa nka ahụ ọsọ ụkwụ eruala.
- O nwekwara ụmụ akụrụngwa ndị ọzo na-enye ahụ ike dịka niacin, thiamine, magnesium, pantothenate folate, potassium, calcium, amino acids, fibre, phosphorus, riboflavin, carbohydrates nakwa vitamin B6.
- Ube na-enye aka igbochi ọbara mgbalielu bụ nke na-akpalite mkpọnwụ ahụ maọbụ mba agbara.
- 'Fiber' dị na ya na-akwusị afọ okuko ma mekwa ka mposi na-aga werewere.
- Ọ na-emekwa ka eze na ukwueze gbasie ike.
- Ube na-egbochị nwaanyị ibute ọrịa kansa mgbe nsọ biri.
- Ọ na agwọkwa akpụkpa, nkwọ ahụ nakwa kọrọkọrọ
- Onweghị ihe ọjọọ ube na-eme n'ahụ ma a racha ya maọbụ te ya ete.
Ya bụ onye hụrụ ube rachawa ya na-adịghị ahụ ube kwa daa.











