'Okra' o nwere ike ibutere nwoke amụghị nwa? Lee ihe anyị chọpụtara

Ebe foto si, Ntanta Soups
Ọkwụrụ so n'otu ihe oriri kacha edozi ahụ dịka nnyocha dị iche iche si gosi.
Mana ụfọdụ na-ekwu na o nwekwara ike ime nwoke agaghị enwe ike ịtụwa nwaanyị ime.
Otu dọkịta a ma ama na soshal midia Naịjirịa bụ Nonso Egemba depụtara na websaịt ya na ọkwụrụ nwere ọtụtụ ihe na-edozi ahụ, mana o nwekwara otu akụrụngwa nke bekee na-akpọ 'gossypol'.
Egemba, onye e ji 'Aproko Doctor' mara na Twitter, kwuru na 'gossypol' a na-ebelata etu ughe (sperm) nwoke si arụ ọrụ.
O kwukwara na ọkwụrụ adịghị mma maka onye nwere ọrịa 'anaemia', ndị na-eme egwuregwu (athletes), nakwa ụmụnwaanyị na-enwe nsogbu ịhụ nsọ ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Lee ihe anyị chọpụtara

Ebe foto si, Ntanta Soups
Dịka Dọkịta Ugo Ezenyirioha si kọwaara anyị, ọ bụ eziokwu na ọkwụrụ nwere 'gossypol'.
O kwukwara na 'gossypol' bụkwa ụdị ọgwụ ndị dọkịta na-enye nwoke iji gbochie ya ịtụwa nwaanyị ime.
"Iri ọkwụrụ ebe o buru ibu ruo ogologo oge nwere ike ime ka nwoke ghara ịtụwa nwaanyị ime n'ụwa ya (sterility)".

Ebe foto si, Getty Images
BBC kpọtụkwaara Oriaku Nwobi onye bụ ọkachamara n'iji nrị enye ọgwụgwụ, nke Bekee kpọrọ 'nutritionist'.
O kwuru na ọrụ ọma ọkwụrụ na-arụ n'ahụ mmadụ buru ibu.
Nwobi kwuru na ọkwụrụ magburu onwe ya maka ndị nwere ọrịa shuga (diabetes), nakwa ndị chọrọ ịta ahụ (weight loss).
O kwuru na o dochaghị ya anya maka akụkọ na ọkwụrụ na-egbochi nwoke ịmụ nwa.
"Aga m enyocha nke a ma zighachitere gị ozi," Nwobi kwuru.
Nchọpụta anyị mere gosiri na ọ bụ mgbe mmadụ na-eri ọkwụrụ ogologo oge, kwa mgbe kwa mgbe, ka o nwere ike ịmetụta ihe o ji amụ nwa, mana ọ bụghị oge niile ka nke a na-eme.
Nnyocha ndị a abụghị ekwuchaa ọgwụ, maka na ụfọdụ ndị ọkachamara ka na-agbagha ya bụ okwu.
Ihe ọkwụrụ na-enye n'ahụ

Ebe foto si, Getty Images
N'agbanyeghi na ọkwụrụ nwere 'gossypol' dịka ụfọdụ ndị ọkachamara si kwuo, o nwekwara ọtụtụ ihe na-edozi ahụ.
Ha gụnyere: Fibre, Magnesium, Vitamin A, Vitamin C, Folic acid (nke dị mma maka ụmụnwaanyị dị ime), Calcium (nke na-enye aka maka ọkpụkpụ), dịrị gawazie.
Ọkwụrụ nwekwara nke Bekee kpọrọ 'Antioxidants' bụ nke na-enye aka egbochi ọrịa kansa, ọrịa shuga, ọrịa obi, nakwa mkpọnwụ ahụ (stroke).
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:











