Life Hacks for pimple: Ihe isii dị n'usekwu gị i nwere ike iji gwọọ 'pimple'

Pimpul

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Pịmpụl bụ ọnọdụ mmanụ na akpụkpọ ahụ kpọnwụrụ akpọnwụ ịkpọchi ohere ajị dị n'ahụ mmadụ, ọkachasị n'ihu, obi, ogbe azụ na ubu.

Ihe na-ebute pịmpụl; ahụ mmadụ na-ewepụta mmanụ rinne, nje na-ebute ọrịa banye mmadụ na-arụ m nke na-emekarị ndị na-etolite etolite.

Dịka Dkta Chidinma Okafor bụ dọkịta ahụike ọha ma bụrụkwa ọkachamara n'ihe gbasara akpụkpọahụ si kọwaa, ihe mere pịmpụl ji emekarị n'ebe ndị a bụ na ha bụ akụkụ ahụ nwekarịchara akpa na-emepụta mmanụ n'ahụ nke Bekee kpọrọ "sebaceous glands".

Pịmpụl na-eme ka akụkụ ahụ ebe ọ metụtara chakarịa maọbụ jikarịa ebe ndị ọzọ.

Pịmpụl nwekwara ike ime onye ọbụla n'agbanyeghị afọ ole ọ dị, mana ọ na-emekarị ndị na-abanye okorobịa na agbọghọ.

Ndị ọkachamara ahụike na-ekwu na ihe na-ebute pịmpụl gụnyere; ahụ mmadụ na-ewepụta mmanụ rinne, nje na-ebute ọrịa banye mmadụ na-ahụ, na iri nri nwere oke mmanụ na shuga.

Dkta Okafor kwuru na mgbanwe mmiri ahụ mmadụ na ihe ọnọdụ pụrụ iche dịka ime, nsọ nwaanyị, ịbanye oge okoro na agbọghọ nwere ike ibute pịmpụl maọbụ mee ka ọ kawanye njọ.

Ihe ọzọ nwereike ịgbanye mmanụ n'ọkụ na-enwu enwu dịka o siri kọwaa bụ "kemịkal na-eṅomi mmiriahu a kpọrọ 'estrogen' ịbanye mmadụ n'ahụ site na nri, ọgwụ, mmiri, ude maọbụ atịtị si na gburugburu."

O kwuru na 'estrogen' na-ebute mmụba mkpụrụ ndụ (cell) mara abụba n'ahụ.

Ihe ndị dị n'usekwu gị nwereike igboro gị maọbụ nwa gị ọgụ pịmpụl:

Dọkịta Okafor kọwara na mmadụ inwe ezigbo akpụkpọ ahụ bụ pasentị 75 ihe oriri eri ebe naanị pasent 25 bụ ihe o tere ete, ya mere ọ ji dị mkpa itinye anya n'ihe ị na-eri iji gbalahụ nsogbu pịmpụl.

Dọkịta Uche nyere ndụmọdụ ka ị zere ụfọdụ nri ma tinye uchu na iri ụfọdụ ndị ọzọ.

Ụfọdụ nri nwere ike ime pịmple gụnyere pasta, chim-chin, meatpie, na ụfọdụ nri ndị ọcha dị na komkom n'ihi na ha na-enwe oke mmanụ.

Lee ụfọdụ ihe ndị ahụ n'usekwu gị nwere ike igboro gị maọbụ nwa gị ọgụ pịmpụl:

1. Mmanụ 'black seed oil'

Black seed oil

Ebe foto si, Getty Images

E kwuo okwu iji mmanụ 'black seed oil' agwọ pịmpụl, ọ ga-adị ka iji agbara agwọ ọjọ mana dịka ndị o doro anya si kwuo, mmanụ 'black seed oil' bụ ezi mmanụ na-agbara pịmpụl ụgbọ nwa mkpi dịka ọ na- egbu nje na-ebute ya.

"Ọ bụrụ na ị na ị ṅụọ ma teekwa ya ete, ọ ga-ebupuru gị pịmpụl ma mee ka ahụ gị na-akwọ mụrụ mụrụ."

"Black seed oil nwere 'zinc', 'linoleic acid nke bu 'Omega 6' pasentị 55.6 ma nwekwa - Oleic Acid nke bu 'Omega 9' pasentị 22.6."

Dkta Okafor nyere ndụmọdụ ka ị ghara ite nnukwu kama rụrụ mmanụ ahụ kpọmkpọm atọ maọbụ anọ, were nwayọọ terụọ ya n'ahụ. Ṅụkwa otu ngazị nwa mmanụ ahụ kwa ụbọchị.

2.Osikapa ndị Igbo (Brown rice)

Dkta Uchendu bụ ọkachamara n'ihe gbasara nri na etu o si enyere ndụ aka na mahadum 'National Open University of Nigeria' (NOUN) si kwuo, ọ dị mkpa ị na-eri osikapa a kpụchaghị akpụcha ma hapụ nke a kpụchara akpụcha (polished rice).

Osikapa a kpụchaghị akpụcha bụ osikapa ndị Igbo, dịka osikapa Abakaliki, Nsụka, Adanị dgz.

"Ha nwere ihe na-amịcha mmanụ n'arụ ma ọbụrụ na i rie ha."

Agwa

Agwa

Ebe foto si, FoodAce

Nkọwa foto, Lekwa etu agwa na anụ ọkụkọ siri dị ka di na nwunye

Dịka ọkammụta Florence Uchendu si kọwaa, nri dị ka agwa na nri ndị ọzọ nọ n'ezinaụlọ ahụ dịka akịdị, fịọfịọ na 'soyabeans', na-egbu pịmpụl.

"Ha nwere 'zinc'. Nri nwere 'zinc' na-eme ka ohere dị n'ahụ(akpụkpọ ahụ) ghara imechi."

Ọ kọwakwara na nri nwere zinc na-enwekwa akụrụngwa Bekee kpọrọ 'Niacin' na 'Pantothenic acid' na-edozi ahụ ma mee ka ohere dị n'akpụkpọahụ ghere oghe.

Uchendu dụrụ ọdụ ka ndị nwere pịmpụl na-agbalị iri agwa maọbụ nri yiri ya o pekata mpe miligram iri anọ (40 miligram) n'ụbọchị.

Gee ihe Dkta Florence Uchendu kwuru n'uju ebe a:

Aha onyonyo, 'Agwa na nri ndị ọzọ e ji agwọ 'pimple'

4. Mmanụa

Mmanụ aṅụ

Ebe foto si, Getty Images

Ama m na ị ma na ndị na-asọ shuga na-eji mmanụ aṅụ edochi ya maka inweta ọnụ ụtọ na nri ha, mana ị ma na mmanụaṅụ bụ ọkpọka maka ịgwọ pịmpụl?

Dọkịta Okafor kwuru na "mmanụaṅụ nwere 'oligosaccharides' nke na-enye aka ikwado mmụba ezigbo nje n'akpụkpọahụ."

Ite ya n'ihu ga-alụrụ gị ọgụ pịmpụl n'ụzọ pụrụ iche.

5. Ajaụpa

Ajaụpa

Ebe foto si, Getty Images

I so na ndị na-achọ ihe dị n'ala n'uko elu? Anya ruo gị ala!

I nwere ike ịgwọ pịmpụl site na-ịgwọ aja ụpa, ajaụrọ maọbụ ajanzu, tee ya n'ihu, hapụ ya nwa oge ma sachapụ ya.

Dkta Okafor kọwara na "aja ụpa nwere ike pụrụ iche (electromagnetic charges) ịdọpụta atịtị dị n'akpụkpọahụ."

O kwukwara na ụfọdụ ajaụpa dịka 'bentonite clay' na 'kaolin clay' nwereike ime ka mmadụ nwuwanye ọcha.

6. Akwụkwọ nri na mkpụrụosisi

Akwụkwọ nri na mkpụrụosisi

Ebe foto si, Getty Images

Dịka Uchendu, onye bụ onyeisi ngalaba ahụike ọha na mahadum NOUN kwuru na akwụkwọnri dịka ụgụ, inine, karọt, tomato (dgz) na mkpụrụosisi dịka ụtụ, ọkwụrụ ezi, oroma, ụkpa (dgz) nwere 'Vitamin A' nakwa'antioxidant na-enyere akpụkpọahụ aka ịkwọ mụrụmụrụ.

O kwukwara na iri anụ torotoro nakwa azụ nwere mmanụ na-adịkwa mma maka ịgwọ pịmpụl.

Ụdị nri nwereike ibutere gị pịmpụl ị kwesịrị ịgbara ọsọ

Dịka Uchendu si kọwaa, nri komkom nke Bekee kpọrọ 'canned food' nwere oke abụba ọjọọ (satụrated fat), flọ nakwa shuga nwere ike ịbọlite pimpụl.

Ya mere, sere aka gị na nri ndị a:

  • Bọta
  • Flọ
  • Osikapa a kpụchara akpụcha
  • Pasta (nri chere-were)
  • 'Chin-chin'
  • Kpọf-kpọf
  • 'Meatpie'
  • Bredị e ji 'wheat' a kpụchara akpụcha were mee

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: