Okazi Festival: Ihe mere ndị Emii jiri na-akwanyere Ọkazị ugwu
Ọkazi bụ akwụkwọ nrị eji ete ofe, ma jikwara ya agwọ ngwọ ngwọ na ihe ndị ọzọ.
Obodo Emii dị n'Imo steeeti nwere oriri ha na-eri maka ọkazị.
Ka ha siri kụọ akụkọ ya, ha si na ọ bu nna mụrụ ha aha ya bụ Emii choputara akwụkwọ nrị a ma rie ya hu na ọ dị ya mma na-ahụ.
N'oge emume ọkazị a, ndị Emii adịghị ese okwu maọbu lụọ ọgu.
Ha sị na oge emume a, onye ọbụla nwereike ga rie nri ebe ọbụla ọ chọrọ.
Ọzọkwa bu na ọ bụ naanị ọkazi ka a na-esi n'obodo ahu n'oge emume ọkazị.
Ndị mere akụkọ a bụ Ikechukwu Kalu na Vining Ogu






