Mbaka sị na Buhari abụghị nsogbu Naịjirịa

Aha onyonyo, Mbaka sị na Buhari abụghị nsogbu Naịjirịa

N'ime vidio a, Fada Ejike Mbaka nke Adoration Ministries n'Enugwu steeti sị na ọ na-akwado Onyeisiala Muhammadu Buhari maka o nwere ihe ọ na-arụ n'obodo Naịjirịa.

Onyonyo a sonyere akwa arịrị ndị mmadụ na-ebe maka ka ogbugbu na ahụhụ jupụtara n'obodo site ihe ndị mmadụ kpọrọ ndọlazụ Naịjirịa na-agabiga n'okpuruọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari.

Mbaka gara ihu kọwa na Onyeisiala Muhammadu Buhari abụghị nsogbu Naịjirịa nwere.

Cheta na na 2015, Fada Mbaka bụ onye ụkọchukwu Katolik pụtara kwadosieike Onyeisiala Muhammadu Buhari bu ọkọlọtọ All Progressives Congress, ma buokwa amụma na onye bubu Onyeisiala bụ Dọkinta Goodluck Ebele Jonathan ga-ada ntuliaka.

Amụma ya a wuru ewu mgbe ahụ mere ka ndị mmadụ na-eche na ya bụ onye ụkọchukwu ọ na-akwado mmadụ na ndọrọndọrọ ọchịchị?

Gịnị mere okwu ya maka nsogbu Naịjirịa nwere ji we wuo?

  • Ọtụtụ ndị sị na ndịda Naịjirịa tụmadị ụfọdụ si ba mpaghara ọwụwaanyanwụ na-akwado ndị patị ndọrọ ndọrọ ọchịchị Peoples' Democratic Party bidoro chịwa site 1999 mgbe Naịjirịa nabatara ọchịchị onyekwuo uche ya kama ha anaghị akwadokebe All Progressives Congress.
  • Akpamaoke agbụrụ n'etiti ndị Ugwu na ndị Ndịda Naịjirịa mere nkwado Fada Mbaka, onye ụkọchukwu Katolik ji akwado onye isi ala Mohammadu Buhari mere ka o wutere ndị Igbo nke nnukwu.
  • Nke a gbaliri elu mgbe Fada Mbaka jiri buo amụma n'oge ntuliaka nke afọ 2015 na Onyeisiala chiburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan agaghị emeri ntuliaka ji wute ndị mmadụ ebe o buru ibu.
Fada Mbaka
Akara ntụ-ntụ

Onye bụ Fada Mbaka?

Fada Ejike Mbaka bụ ụkọchukwu ndị Katọlik bụrụkwa onyeisi ndị Adoration Ministry bụ ụlọekpere nke o hiwere nke sokwa ụlọụka Katolik n'afọ 1998.

Ndị nsonso ya na-ekwokarị n'igwe n'igwe n'ụlọụka ya bụ Adoration Ministries dị n'Enugwu steeti. Ha na-ekwokarị ịbịa kpee ekpere kwa izu.

Ama ya dịka onye na-etinye okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ọdịmma ndị mmadụ.

Ama ya maka amụma ọ na-ebukarị ndọrịtaụka n'etiti ma ndị nkịtị ma ndị ụkọchukwu.