Ejike Mbaka(Rev Father) adọọla ndị ọchichị Naịjirịa aka na nti

Aha onyonyo, Ejike Mbaka(Rev Father) adọọla ndị ọchichị Naịjirịa aka na nti

Rev. Father Ejike Mbaka akatọla etu ụfọdụ ndị ọchịchị Naịjirịa si achigbu ụmụ Naịjirịa.

O kwuru na ụfọdụ ndị ọchịchị Naịjirịa na-ebi ndụ ha ka a ga-asị na ụwa anaghị agwụ agwụ.

Mbaka kwuru na gọomenti nọ n'ọchịchị ugbua kwesiri rio mgbaghara ma rịọchitere ndị chiburu Naịjirịa tupu ha eweghara ọchịchị.

O kwuru na Buhari kwesiri inweta ogugbo were ndị na-eme mpụ gbaa onwe ya okirikiri.

Gere ihe fada Ejike Mbaka kwuru n'uju.

Onye bụ Fada Mbaka?

Fada Ejike Mbaka bụ ụkọchukwu ndị Katọlik bụrụkwa onyeisi ndị Adoration Ministry bụ nke o hiwere n'Enugu, Enugu steeti, Nigeria.

Ama ya dịka onye nwere nkwuweokwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ọdịmma ndị mmadụ.

Ama ya maka amụma ọ na-ebukarị kwamgbe.