O nwee ihe m ga-eji kpọọ Buhari asi ọ bụ maka Mbaka - Fada Obiekezie

Aha onyonyo, Ihe Fada Obiekezie kwuru maka Mbaka

Dịka Fada Ejike Mbaka bụ onyeisi "Adoration Ministry" n'Enugwu steeti kwuru na e nwere ndị chọrọ igbu ya, enyi ya nwoke bụ Fada Cajetan Ifeanyichukwu Obiekezie gwara BBC iwe ya banyere ihe ọ na-agabiga ugbua.

Fada Obiekezie sị na iwe ya bụ na Mbaka gara tere nsị onye ọzọ n'ahụ nke kpatara ijiji na-eso onye ahụ ji na-esozi Mbaka.

Gee ya ntị n'ọnụ ebe a.

Mbọ anyị gbara ịnụta n'ọnụ ndị na-ekwuchitere Mbaka kpụru n'ala dịka akara ekwenti eji enweta ha ha tinyere na facebook ndị "Adoration Ministry Enugu Nigeria - AMEN" agaghị aga.

Ọrụ a si n'aka Chioma Obianinwa na Nnamdi Agbanelo