End Sars: Ihe Fada Mbaka gwara ndị kwuru na ha ga-agba 'Adoration Ministry' ọkụ
Ụkọchukwu ama ama bụ Fada Ejike Mbaka ekwuola na o nweghi onye kachasị akwado ndị ntoroọbịa na Naịjirịa karịa ya
Mbaka kwuru nke a mgbe ọ na-akatọ akụkọ pụtara na soshal midia na ndị omekome gbara ụlọ ekpere 'adoration' nọ n'Umuchigbo ọkụ n'ihi ngagharịiwe Endsars.
Ọ dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara ị na-ekwuto aha ya na soshal midia ma na-atụ asị emegide ya.
O kwuru na onweghi enyemaka ọbụla 'adoration ministry' nweterela n'aka Onyeisiala Buhari kamgbe ọ bara ọchịchị.
O kwuru na o nweghị 'oil block' ọbụla Onyeisiala Buhari nyere ya nke o ji enwe onye ewere n'ọrụ n'aha ya.
Nlegharị anya BBC Igbo legharịrị n'ogige ekpere a gosikwara na ọ bụ eziokwu na o nweghị ọkụ ọbụla a gbara n'adoration' Enugwu.