Archbishop Adewale Martins ekwuola na amụma Mbaka buru maka Hope Uzodinma na-eme ihere
Achịbishọp Adewale Martins nke Legọs Katọlịk Dayọsis ekwuola na ihe ụka Katọlik nwereike ime gbasara Fada Ejike Mbaka bụ ịmachi ya ime 'adoration ministry' ya.
Achịbishọp Martins kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ebe ọ tinyere ọnụ n'ihe gbasara amụma Fada Mbaka buru maka Hope Uzodinma iweghara oche ọchịchị Imo steeti.
O kwuru na ọ bụ ihe ịtụ n'anya na Mbaka ga-ekwunwu ụdịrị okwu ahụ banyere ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, ma kwuo na ọ bụ ihe na-eme ihere.
Ọ sị: "I kwusị ya ime mịnịstrị ya bụ ihe e nwere ike ime ya."
O kwukwara na dịka ụlọụka, na ha kwesịrị ị na-ekwu okwu site n'ọnọdụ ụkpụrụ.
Gee ihe ndị ọzọ o kwuru n'uju.
Ndị mere ihe nkiri a bụ Nnamdi Agbanelo na Jessica Nwankwo.