Hope Uzodinma adịghị ege m ntị unu etịkọzịna aha anyị - Fada Mbaka

Aha onyonyo, Hope Uzodinma adịghịzi aza ekwentị m - Fada Mbaka

Fada Ejike Mbaka bụ onye ọtụtụ mmadụ na-ahụta dịka onye aka ya dị n'oche Hope Uzodinma nọ ugbua dịka aka na-achị Imo steeti, kwuru na kemgbe o rigoro n'ọchịchị, ọ naghị aza ekwentị ya ma ọ kpọọ ya.

Mbaka sị ka ndị mmadụ ghara ịkpọ aha ya ma ha kpọwa aha Uzodinma makana kemgbe o nwere mmeri, ọ laghachiteghi ụlọụka ya bịa nye Chukwu ekele.

"Ọ bụghị na m na-arịọ ya ego, ọ bụ ka m were nye ya ndụmọdụ maka ọchịchị ọma."

Ọ gakwara n'ihu kwuo na Imo steeti nọ n'ọnọdụ ọjọọ, dịka o kwuru na steeti ahụ na-achọzị omimi.

Lee ihe ọzọ Mbaka kwuru n'onyonyo a.