Hope Uzodinma adịghị ege m ntị unu etịkọzịna aha anyị - Fada Mbaka
Fada Ejike Mbaka bụ onye ọtụtụ mmadụ na-ahụta dịka onye aka ya dị n'oche Hope Uzodinma nọ ugbua dịka aka na-achị Imo steeti, kwuru na kemgbe o rigoro n'ọchịchị, ọ naghị aza ekwentị ya ma ọ kpọọ ya.
Mbaka sị ka ndị mmadụ ghara ịkpọ aha ya ma ha kpọwa aha Uzodinma makana kemgbe o nwere mmeri, ọ laghachiteghi ụlọụka ya bịa nye Chukwu ekele.
"Ọ bụghị na m na-arịọ ya ego, ọ bụ ka m were nye ya ndụmọdụ maka ọchịchị ọma."
Ọ gakwara n'ihu kwuo na Imo steeti nọ n'ọnọdụ ọjọọ, dịka o kwuru na steeti ahụ na-achọzị omimi.
Lee ihe ọzọ Mbaka kwuru n'onyonyo a.