Flora Nwapa: Nwaanyị ike zara Ogbuefi na ndụ ya

Ebe foto si, Getty Images
E nwereike ịgụpụta ndị odeakwụkwọ si Naịjirịa ghara ịkpọ aha Flora Nwanzuruahu Nkiru Nwakuche Nwapa? Ọ dị egwu!
Nwapa bụ "a takata a gbọo" n'ide akwụkwọ, nke mere ka ụmụnna ya chie ya Ogbuefi ma mee ka mbaụwa mara onye ọ bụ.
Tupu ndị mmadụ etibe mkpu maka ịbụ "feminist" n'ọgbaraọhụrụ a, Nwapa akpawala ike n'ụzọ nke ya iji gosi na ọ bụ ihe ọ bụ.
Ọtụtụ akụkọ o dere bụ maka ihe nwaanyị na-agabiga ma n'ala Igbo ma na Naịjirịa.
Lee ihe ndị ị kwesịrị ịma maka Ogbuefi Nwapa
- A mụrụ ya n'ụbọchị 13 nke ọnwa Jenụwarị, 1931
- Ọ bụ nwa mbụ n'ime isii nne na nna ya mụrụ
- Ọ gara akwụkwọ n'Ugwuta bụ ebe o si, Pọtakọt nakwa Legọs
- Ọ gara mahadum na University College nke Ibadan site n'afọ 1953 ruo 1957, tupu ọ gafee Mahadum nke Edinburgh dị na mba Skọtland
- kuziri nkuzi ma rụkwaa ọrụ Bekee site n'afọ 1959 ruo mgbe agha Biafra malitere n'afọ 1967
- Mgbe agha biri, ọ rụrụ dịka Minista ahụike nakwa mmekọrịta mmadụ na mmadụ. Ọ rụkwara dịka Minista na-ahụ maka ihe gbasara ala na mmepe obodo n'okpuru Ist-Sentralụ
- Otu ihe o mere dịka minista na-ahụ maka mmepe obodo oge agha biri bụ imepe mmiri Oguta Lake ka ọ bụrụ ebe ndị mmadụ na-abịa elegharị anya
- O mechara mepee ebe a na-ebiputa akwụkwọ nke ọ kpọrọ Tana Press/Flora Nwapa Company
- O dere ọtụtụ akwụkwọ gbasara ihe ụmụnwaanyị na-agabiga n'ala Igbo dịka ọ nụchara akụkọ ụmụnwaanyị dị iche iche na-abịa na nke nne ya adụ akwa
- Akwụkwọ ndị ọ dere gụnyere Efuru, Idu, Women are Different, One is Enough, This is Lagos and Other Stories na ndị ọzọ
- Efuru bụ akwụkwọ mbụ o dere n'afọ 1962, nke e biputara ka o zigachara Chinua Achebe bụ odeakwụkwọ a ma ama ya bụ akwụkwọ. Achebe ji aka ya zigara ya na-ebiputa akwụkwọ
- Nke a mere ka Nwapa bụrụ nwaanyị mbụ si Naịjiria na-ede akwụkwọ e biputara ebiputa, Efuru na onwe ya bụkwanụ akwụkwọ mbụ si n'aka nwaanyị onye Afrịka a na-ebiputa na Bekee
- Akwụkwọ o dere gbasara agba Biafra gụnyere "Never Again" na Wives at War and Other Stories
- O dekwara mbem nke a kpọrọ Cassava Song na Rice Song na akwụkwọ ụmụaka dị iche iche
- Akwụkwọ ya niile gosiri ikike ụmụnwaanyị nwere, nke bụ ihe Bekee na-akpọ "feminist"
- N'ihi ihe o ji aka ya deta, ọ gagharịrị mpaghara ụwa dị iche iche wee kuzie nkuzi ma kwuo okwu gbasara ihe metụtara ụmụnwaanyị ọkachasị ndị nke na-ede akwụkwọ
- A na-ahụ ya dịka 'nne' edemede ọgbaraọhụrụ
- Ọ mụrụ ụmụ atọ; nwaanyị abụọ na otu nwoke
- Ọ nwụrụ n'ụbọchị 16 nke ọnwa Ọktoba, 1993






