End SARS: 'Ndị omekome kụrụsiri ụlọ oriri m na ngaghariwe End SARS mana ọ kwụrụla ugbua'
Ka BBC Igbo gosichara ka esi wakpoo ụlọ oriri Obum Okemuo n'oge e mere ngaghariwe End SARS, Obum arụgharịala usekwu ya.
Obum gwara BBC Igbo na o nwetara enyemaka n'aka ụfọdụ ọyị ya nụrụ ma kirie ihe mberede mere ụlọ oriri ya.
O kwuru na o ji otu izu ụka we rụgharịa ebe ahụ ma mepe ya n'otu izu ụka ahụ kwa.
O kwuru na ọ bụ eziokwu na ọrụchabeghị ihe niile o kwesiri ịrụ mana o jigodu ego ndị batara ya aka nakwa ego nke ya mezuo ma malitegodu ulọ ọriri ya ọzọ.
Lee ụfọdụ foto etu nrụgharị usekwu ahụ si gaa.

Ebe foto si, Obum Okemuo
O jizi igwe wee gbaa glassi ndị omekome kụwasiri na mbụ okirikiri.

Ebe foto si, Obum Okemuo
Obum na ụfọdụ ndị biara ikwado mmepe ụlọ oriri ya.

Ebe foto si, Obum Okemuo
Cheta na Obum Okemuo bụ onye azụmaahịa mepere ụlọ oriri na ngoli n'ọnwa Julai, 2020.
Ka o ruru n'ụbọchị October 2020, ndị omekome weghara ngaghariwe SARS banye n'ụlọ oriri ya ahụ wee tiwasa ụzọ nkụwa ya ma bụkọrọ ihe niile o ji hazi ụlọ oriri ya.
Okemuo kwuru na ha bụkọrọ njuoyi ukwu 7, njuoyi 5, ntuoyi ya niile , ite 25, ihe niile dị mkpa di n'ime igwe na-enye ọkụ.
O kwuru na ugbua ụmụ ọrụ ya 19 enweghịzị ọrụ.
Gere ya n'uju ka ịmata ihe ndị ọzọ o kwuru maka nwakpo a.