'Etu e si gbagbuo ụtọ obi m n'ihu m n'Oyigbo'- Monday Bakor

Aha onyonyo, 'Etu e si gbagbuo ụtọ obi m n'ihu m n'Oyigbo'- Monday Bakor

Akwa arịrị ka Monday Bakor ji gwa BBC Igbo etu mgbọ si n'egbe ndị ọrụ nchekwa gbara n'ụlọahịa ya, si tugbuo Queen Nwazuo bụ nwaanyị ọ na-akwado ịlụ n'ihu ya n'Oyigbo, Rivas Steeti.

Bakor kwuru na ihe a mere n'ụbọchị Ocktoba 22, 2020 mgbe ha nọkatara nụwa ụda egbe aghara aghara n'okporoụzọ Oyigbo.

O kwuru na ọ bụ ebe ha na-akwado imechi ụlọahịa ha ka ha nụchara ụda egbe ka onye uweojii kpu okpu na-acha uhie uhie gbapụrụ egbe n'ebe ha nọọ ma gbuo Queen.

Bakor kwuru na ọ na-efe ala nna ya n'Oyigbo.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Nnamdi Omoni kwuru ka Monday Obakor bia mee mkpesa gbasara ọdachị a n'ụlọọrụ ha ma ewepụ mmachị ngagharị dị n'Oyigbo ugbua.

Cheta na ndị omekome weghara ngaghariwe udo ndị End SARS mere nso nso a wetere ọgbaghara n'Oyigbo mere ka gọọmenti Rivers State tinye mmachị ngaghari ebe ahụ.

Akụkọ mechakwara pụta na ndị ọrụ nchekwa na-aga n'ụlọ egbu ndị ha chere na ọ bụ ha wetere ọgbaghara a, mana anyị ka na-enyocha akụkọ ahụ ịmata maọbụ eziokwu.

Gere ihe o kwuru n'uju n'ihe nkiri a.

Ihe nwanne nna Queen Nwazuo o jiri mere nne kamgbe nne na nna ya nwụchara bụ Evangeline Mgbeahụrụ kwuru na anapụla ha nwata bu oke amamihe.

Evangeline kwuru na Queen bụ nwata na-enweghị nne na nna makana ha anwụọla mgbe ọ nọ elementri 2.

O kwuru na Queen bụ nwata akwụkwọ Mahadum Abia Polytecnic, Aba branch.

O kwuru na ọ bụ ezigbo nwa na-erube isi ma nwe oke amamihe.

O kwuru na ka ọ dị ugbua, ha ebulatabeghị ozu Queen n'Abia steeti ebe o si makana obodo Oyigbo ka dị ọkụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: