Arthur Nzeribe: Ihe i kwesịrị ịma maka Ogbuagu Oguta

Ebe foto si, Tonynwajeipost
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
A jụwa ajụjụ ala, ajụọ ewi, mana akọwa akụkọ ndọrọndọrọ ọchịchị n'Imo steeti, a ga-akpọrịrị aha Francis Arthur Nzeribe.
Ọtụtụ ndị na-eto eto ugbua agaghị ama aha a bụ Arthur Nzeribe, maka na e lewe ihu agadi nwaanyị, ọ dị ka ejighi ego lụọ ya.
Arthur Nzeribe bụ onye nọchitere anya mpaghara ọdịda anyanwụ Imo steeti n'ụlọ Sineti Naịjirịa malite n'afọ 1999 ruo 2007.
A kpọọ aha ya taa, ụfọdụ ga-ama ọsụ, mana ụfọdụ kwa ga-asị na ọ bụ dike.
Taa, bụ abalị abụọ nke ọnwa Nọvemba 2020, ka Arthur Nzeribe gbara afọ iri asatọ na abụọ (82),
Mana lee ihe kpatara ọtụtụ ji hụ ya n'anya ebe ndị ọzọ kpọrọ ya asị.
Lee ihe mere ụfọdụ ji akpọ Arthur Nzeribe dike

Ebe foto si, Sun News Publishing
- Ụbụrụ Arthur Nzeribe na-aghọ nkọ, nke mere o ji nweta agụmakwụkwọ n'efu na mba Ịngland n'afọ 1957.
- Nzeribe na Kwame Nkrumah rụkọrọ ọrụ. Cheta na Nkrumah bụ onye gbara mbọ maka nnwereonwe nke mba Ghana
- Ụlọọrụ ya bụ FANZ, nke o hibere n'afọ 1969, so n'ụlọọrụ Naịjirịa a kacha anụ aha ya n'ụwa n'oge ahụ
- Nzeribe zọrọ ọkwa Sineti n'afọ 1983, mana ọ bụ n'otu afọ ahụ ka ndịagha weghaara ọchịchị
- O mechara zọkwaa ọkwa sineti n'afọ 1999 ma merie, nọgide ebe ahụ ruo 2007
- Ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si n'aka Arthur Nzeribe selite isi. Ndị dịka John Oyegun, Emeka Ihedioha, Gerald Irona na ndị ọzọ.
- Ụfọdụ kwukwara na Arthur Nzeribe Foundation enyela ọtụtụ ndị mmadụ agụmakwụkwọ n'efu
- O dere ọtụtụ akwụkwọ gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa
- Aha otutu Arthur Nzeribe gụnyere: Ogbuagu, Oshiji, Demanze, Oyimba
Ihe ụfọdụ ji kpọọ Arthur Nzeribe asị

Ebe foto si, NAtionalhelm.co
- Nzeribe so n'isi sekpụ ntị maka nkagbu a kagburu ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa e mere n'abalị iri na abụọ nke ọnwa Jun (June 12) afọ 1993
- Ọ bụ Nzeribe bụ onyeisi otu kpọrọ onwe ha 'Association for Better Nigeria (ABN)' nke gara nata akwụkwọ ikike n'ụlọikpe iji gbochie ntuliaka ahụ
- Ọ bụ n'akwụkwọ ikike a ka onyeisiala oge ahụ bụ Ibrahim Babangida gbakwasara ụkwụ iji kagbuo ntuliaka Jun 12
- Ọtụtụ kwuru na onweghị ihe gbara ọkpụrụkpụ Nzeribe mepụtaara ndị be ha n'afọ asatọ ọ nọrọ na sineti
- Ụfọdụ akụkọ kwukwara na Arthur Nzeribe zụrụ ahịa egbe. Ha sị na o resịrị Naịjirịa nakwa Bịafra egbe n'oge agha, mana amachabeghị ma nke a ọ bụ eziokwu
- E boro Nzeribe ebubo na o riri ego dị nde naịra iri abụọ na abụọ (N22 million), ma chụpụ ya n'ụlọ omeiwu ukwu.
- Na 2006, Osita Izunaso meriri Nzeribe dịka onye ga-anọchị anya ndị Imo West. Otu a ka ọsọ ndọrọndọrọ ọchịchị Nzeribe si nyụọ ka ọkụ.
- N'okwu gbasara nkewapụta steei ọhụrụ, Nzeribe akwadoghị ka e nwee Orlu steeti, nke mere ya na aka na-achị Imo steeti oge ahụ bụ Achike Udenwa see nnukwu okwu
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:














