Mkpu akwa ka na-ada n'Awgu n'ihi ụgbọala gburu mmadụ 21 gụnyere ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi ha
- Onye dere ya, Ebere Ekeopara
- Ndị mere akụkọ a, Reporter, Igbo Service
Ụbọchị wenezde 28th October bụ ụbọchị ndị Awgu n'Enugwu steeti agaghị echefu ọsịsọ.
Ọ bụ n'ehihe ụbọchị ahụ ka ụgbọala 608 bu ụmụakwụkwọ Presentation nursery and primary school dị n'Awgu ala n'ụlọ ha, na ụgbọala a na-akpọ "Low bed" eji ebu 'bulldozer' kụkọrọ isi n'ebe a na-akpọ Nkwo dị nso ụlọọrụ okpuruọchịchị ha.
Ya bụ Low bed kụbara 608 ahụ na mmiri Nkwo ahụ ma sorokwa ya dakpuo n'ime ebe ahụ.
Dịka onye isi ndị na-ahụ maka ọdịmma okporoụzọ (Federal Road Safety Corps - FRSC) n'Enugwu steeti bụ Mazi Ogbonna Kalu siri kwuo, mmadụ 21 nwụrụ anwụ pịị ozugbo, nke gunyere ụmụakwụkwọ, ndị nkuzi ha nakwa ọkwọụgbọala ụmụakwụkwọ ahụ.
Mgbe BBC rutere na Nkwo Awgu, ebe mkpamkpa ahụ kpara, anyammiri na iru uju ka anyị hụrụ.
Nwoke na-arụ taya ụgbọala (vulcaniser) ebe ahụ na nwa ọrụ ya soro nwụọebe ahụ n'ihi na low bed ahụ korola ha tụkpuo na mmiri.

Nwunye nwoke ahụ na-arụ taya bụ Chukwuokoro Ifeoma, bere akwa ka ọ na-agwa BBC na ọ bụ naanị di ya na-eweta ego nri n'ụlọ, na ya enweghịzị onye enyemaka.
Nwaokorobịa Chidubem Eze bụ onye nwanne ya na-agba ọgbatumtum, gwara BBC na ya eburula ozu nwanne ya tinye n'ebe nchekwa ozu.
Mgbe BBC garuru na ya bụ ụlọakwụkwọ ebe ụmụaka ahụ si, bụ nke ụka Katọliki nwe, onyeisi ha bụ Rev Sister Ebubechukwu Chifoma, ji anyammiri kwuo na obi agbawaala ya n'ihi na ya amaghị ebe ya ga-ebido ebido kasiwe ndị nne na nna ụmụ ha nwụrụ obi.
Bishọpụ ụka Katọliki nke Awgu Diocese bụ Rt. Rev John Okoye, kwuru na e liela ụfọdụ ụmụaka ahụ ebe ha na-ekpe ekpere ka ndị nọ n'ụlọọgwụ gbakee.

Osote Gọvanọ Enugwu steeti bụ Cecilia Ezeilo bịakwara mgbaru n'ebe mkpamkpa ahụ kpara na Nkwo, ma gakwaara Bishọpụ Katọliki Awgu mgbaru.
Osote onyeisioche Awgu bụ Ọkaiwu Lotachukwu Ogbonnia kwuru na ha na ndị obodo ejirila aka ha na-etinye mgbochi ga-eme ka ụgbọala jiri nwaayọ rifee ebe dị iche iche n'ụzọ ahụ, iji belata oke ọsọ ganye na gọọmenti arụzie ya bụ ụzọ.
Ọtụtụ ndị hụrụ mgbe ọdachi ahụ mere kwuru na ọ dị ka ya bụ ụgbọala Low bed enweghị breeki, tinyere na ọ nọkwa n'oke ọsọ.
Nnchọpụta anyị mere gosiri na ya bụ mgbada ugwu Nkwo Awgu na-enwekari ihe mberede nke ụgbọala kwa mgbe kwa mgbe, n'ihi na ọ bụ mkpọda ugwu.









