Imo Tanker Explosion: Etu ọkụ 'tanker' si mebie ihe ma gbagbuo otu nwaanyị n'Owere

Tanka na-agba ọkụ

Ebe foto si, Federal Fire Service, Imo State

Nkọwa foto, Tanka ahụ gbara ọkụ bụ gaasị ka e ji ya ebu

Otu nwaanyị alaala mmụọ oge ihe mberede okporoụzọ mere ka nnukwu ụgbọala bu gaasị gbara ọkụ n'Owere, isi obodo Imo steeti.

Akụkọ kwuru, na ya bụ ihe mere oge ọ fọrọ nkeji olemole ka ọ kụọ elekere iri nke ụtụtụ Fraịde.

Ndị nọ ya oge ihe a mere kọrọ na nnukwu ụgbọala ahụ na-achọ ịtụgharị oge ụgbọala ọzọ ji nnukwu ọsọ suo ya wee nwuru ọkụ.

Ọkụ a gbapịara nwaanyị ahụ n'ime ụgbọala a, mana onye ọkwọ ụgbọala ji ntakịrị ihe lafere, mana ọkụ ahụ merụrụ ya nnukwu ahụ.

Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ Imo steeti mechara bịa gbanyụọ ya bụ ọkụ mana tupu ha abịa, nwaanyị ahụ agbapịala.

Ndịọrụ mgbanyụ ọkụ

Ebe foto si, Federal Fire Service, Imo State

Nkọwa foto, Ndịọrụ mgbanyụ ọkụ bịara gbanyụọ ya bụ ọkụ

Onyeisi ụlọọrụ mgbanyụ na-elekọta Imo na Abia steeti bụ Achi Okidi Ijeoma, gwara BBC na ya bụ ihe mere eme n'Eziokwu.

O kwuru na ndịọrụ ya gbara mbọ nke ọma iji menyụọ ọkụ ahụ.

Mana Ijeoma gbarụrụ ihu etu ndị bi na mpaghara ebe ihe a mere si kpaso ndịọrụ mgbanyụ ọkụ agwa oge ha bịaruru ịgbanụ ọkụ ahụ.

O kwuru na oge ha rutere ebe ahụ, ndị mmadụ malitere ịtụ ha okwute ma mebie ụfọdụ akụrụngwa ha ji arụ ọrụ.

"Ọ bụ site n'enyemaka ndị uweojii ka ndịọrụ anyị ji nwee ike ịgbanyụ ya bụ ọkụ," Ijeoma kwuru.

Ndị uweojii na ndịọrụ mgbanyụ ọkụ

Ebe foto si, Federal Fire Service, Imo State

Nkọwa foto, Ọ bụ ndị uweojii bịara nyere ndịọrụ mgbanyụ ọkụ aka wee gbanyụọ ọkụ ahụ.

Ọ gara n'ihu rịọ ka ndị mmadụ kwụsị ụdị agwa ajọọ a n'ihi na ọ nwere ike ime ka obi jụọ ndịọrụ oyi ịrụ ọrụ ha etu o kwesịrị.

Chioke Ibe kelere ndị uweojii Imo steeti maka etu ha si nye aka hụ na a gbanyụrụ ya bụ ọkụ.

O kwuru na oge ha nọ ebe ahụ, ha hụrụ ka buputere ozu otu onye n'ime ụgbọala ahụ gbara ọkụ, ebe atọ ndị ọzọ ka ha hụrụ merụrụ ahụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Igbo Tradition: Mkpọnala - Egbe ike na-emete mmụọ na mmadụ n'ụra