Obadiah Mailafia: Ọ bụ ndi Fulani m zutere n'ahịa gwara m ihe m kwuru na redio

Ebe foto si, Obadiah Mailafia/Facebook
Obadiah Mailafia agwala BBC na ọ bụ n'ọnụ ndị Fulani o zutere n'ahịa ka ọ nụrụ ihe o kwuru banyere Boko Haram na ụfọdụ aka na-achị Ugwu Naịjirịa.
Cheta na Dọkịta Mailafia sị na e ji ụgbọelu ebugharị egbe na ngwa agha oge Naịjirịa nọ n'ọnọdụ mmachị ngagharị maka coronavirus.
Ọ sịkwa na otu gọvanọ steeti n'ugwu Naịjirịa nọ n'isi ndị Boko Haram.
Mana, na mkparịtaụka ya na BBC mere n'asụsụ Hausa, Mailafia kwugharịrị si na ọ bụ ndị Fulani ya zutere n'ahịa gwara ya ihe a o kwuru.
Ọ sị: "Ọ bụ ka m gara ahịa ịzụ ihe nri ka m zutere ndị Fulani a. Dịka m na-anụ asụsụ ha obele obele, ekelem ha anyị nwere malite mkaprịta ụka bụ ebe ha nọ gbara m ama."
Ka BBC jụrụ ya ma ọ bụ makana DSS kpọrọ ya oku mere o jiri gbajụọ ihe o kwuburu n'elu redio akpọrọ "Nigeria Info", bụ nke juru na ịntanetị. Dọkịta Mailafia sara were sị na ọbụghị eziokwu dịka ndị DSS kwanyere ya ugwu ruru ha.
"Ha na-arụ ọrụ ha ọfụma. Onweghi ajọ ihe ọbụla ha mere n'ụlọ ọrụ ha."
Mailafia sị na ya amaghị na Nigeria Info na-ewere ihe onyonyo oge ha na-agba ya ajụjụ ọnụ were tinye n'ịntanetị.
O gakwara n'ihu kwuo na ya bụ onye udo, nke mere na ya aghaghị eme ụdịrị ihe ga-etinye Naịjirịa na nsogbu.
NBC eriela Nigerian Info nha nde naira ise maka 'okwu asị'
Ngalaba na-ahụ maka mgbasa ozi na Naịjirịa Bekee kpọrọ "Nigerian Broadcasting Corporation" (NBC) dara Nigeria Info iwu nde ise maka mkparịtaụka ha na Mailafia mere.
Onye ụlọọrụ Nigeria Info gwara BBC na ndị isi ụlọọrụ ha akwadobeghi ikwupụta maka iwu 'okwu akpọmaasị' ndị NBC dara ha ugbua.
Mailafia bụbu osote onyeisi ụlọakụ etiti (Central Bank of Nigeria) ma bụrụkwa onye so zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka gara aga na pati a kpọrọ 'African Democratic Congress'.
N'akwụkwọ ozi nke NBC wepụtara n'ụbọchị Tọzde, ụlọọrụ ahụ kwuru na, "NBC dara Nigeria Info 99.3 nha maka ime mgbasaozi n'ụzọ ekwesịghị ekwesị."
Ha kwukwara na redio ahụ nyere ohere ka a na-agbasa ozi nwere ike ibute mpụ na ọgbaghara ọha.
Ọ bụ na mkparịtaụka a kpọrọ "Morning Cross Fire" nke e mere na 'Nigeria Info' n'ụbọchị Monde, abalị iri nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2020, ka Mailafia nọrọ kwụọ na o nwere ndị nọ na gọọmenti ma ka mmiri si banye n'opi ụgbọgụrị n'oke ogbugbu mmadụ na-eme na 'Southern Kaduna'.
Ha kwuru na ya bụ okwu Mailaifia kwuru enweghị ihe a hụrụ anya bụ eziokwu n'ime ya, bịakwa megide iwu maka 'okwu asị'.
Ha gara n'ihu kwuo na nha ahụ ga-abụ ịdọ aka na ntị maka ụlọọrụ mgbasaozi ndị ọzọ.
Cheta na ụbọchị Wenezde, ndị uweojii nzuzo Naijiria a ma dịka 'DSS' kpọrọ Mailafia oku maka okwu o kwuru ma jichie ya awa isii dịka ha na-agba ya ajụjụ ọnụ.










