Madonna students: Ụmụakwụkwọ 7 mahadum Madonna a nọ mkpọrọ apụtala

Ụmụ akwụkwọ nọ mkpọrọ

Ebe foto si, Sopuru Nnamani

Nkọwa foto, Ụmụ akwụkwọ ahụ ka atụghapụrụ ha

Atụghapụla ụmụ Mahadụm Madonna dị n'Okija nọbụ na mkpọrọ

Nwanne otu n'ime ụmụakwụkwọ ahụ agwaala BBC Igbo na ha apụtala.

Sopuru Nnamani sị na nwanne ya bụ Chijioke Nnamani na mmadụ isii ọzọ atụrụ mkpọrọ maka ihe ha dere n'akara soshal midia nwetere ntụghapụ n'aka Ọkaikpe Babatunde Quadri dịka omegharịrị iwu eji jide ha.

Ụmụakwụkwọ a nọ mkpọrọ kemgbe Jenụwarị agbanyeghị na-enyere ha ohere ịla site n'ikpe ekpere na ụbọchị 19 nke ọnwa Maachị.

Ihe ji ha bụbụ na ha enweteghị otu n'ime n'akaebe ha .

Ọ sị na nke dị mkpa maka ezumike ọnwa abụọ ndị ọkaiwu chọrọ ga n'ọnwa na-abịanụ.

Maazị Nnamanị gwara BBC na ha mezuru iwe ụlọikpe sị ha mee n'elekere 6 nke mgbede ụnyaahụ.

Sopuru Nnamani

Ebe foto si, Sopuru Nnamani

Nkọwa foto, Ụmụ akwụkwọ ahụ nọ mkpọrọ kemgbe ọnwa Janụwarị nker afọ a

Akụkọ ga-amasị gị maka iwu "Cyber Crime"

Aha onyonyo, Cyber Crime Law kpụgara m ụlọ mkpọrọ