Angela Nwosu kwuru ihe ise a ga-atụ gị n'anya

Onye ama ama na-eme ihe onyonyo maka aramara bụ Angela Nwosu na BBCIgbo nwere mkparịta ụka ebe o kwuru ọtụtụ ihe ndị mmadụ amaghị maka ihe ọ na-eme.
Lee ya n'uju ebe a
Kama ọ bụrụ na ị chọrọ ya na nkenke, lee ihe ise gbara ọkpụrụkpụ o kwuru:
1) Ụfọdụ ndị Pastor, ndị isi ndị agha na ndị ọgaranya ụfọdụ na-agba ya aka ahịa nke ọma, O kwuru sị "ndị isi ụka na-abịa achọta m maka enyem aka, ha mechaa ha na-ekpere m ekpere".
O kọwara na ọnweghị ihe na-esere ya na ndi ụka.
O kwuru sị "Ọ bụrụ na mụọ gi anabataghị ihe m na-eme, biko a zụla.
2) O kwenyere n'ikikere si n'ala, mmiri na ikuku.

O kwenyere na ha na-ebute ihe ọma
Ọ mara atụ sị na ụfọdụ ndị na-eji ụkwụ ha gaharịa n'obodo ha batara ọhụru ma jiri ọnụ ha kwa ala ahụ ihe ha chọrọ.
3) Angela Nwosu kwenyere na ọ bụghị okwu ọjọọ maọbụ ịkwa mmadụ emu ka mmadụ ga-eji ewebata ihe ọma na ndụ ya.
4) O kwuru na ọ kwụsịri ịga ụlo ụka n'ihe dịka afọ 2015/2016.
Ọ kọwara na ọ bụghị na enwere ihe ọjọọ ọ hụru kama na ọ bụ na omasịghị ya.
5) Nwosu kwuru na-agbanyeghị na Nne ya na ụmụnne ya akwadoghi ihe ọ na-eme, na ha na-ekpere ya ekpere.
O kwukwara na dị ya kwadoro ihe ọ na-eme.
Na mmechi, ọ gwara ndị mmadụ ka ha hapụ iji obi ọjọọ eso soshal Midịa, kama mgbe mmadụ hụru ihe ọma ka onye ahụ kelee Chineke ma kpee ekpere ka onweta nke ya.














