Ihe mere e ji kwụsị Rev. Fada Oliver Ekene Nwosu ọrụ ụkọchukwu n'ụka Catholic

Fada Oliver Ekene Nwosu

Ebe foto si, Fides Media

Ndị ụka katọlịk na Fada Oliver Nwosu ekwuola uche ha maka akwụkwọ na-efegharị n'ịntanetị nke na-ekwu na akwụsịrị Fada Nwosu n'ọrụ maka nrụnrụaka.

Akwụkwọ sitere Dayọsịs Maragoro nke dị na Tanzania na-ekwu na Bishop nke Ọka ekweghị ichi Nwosu ụkọchukwu maọbụ nye ya ikike ịka ụka.

Akwụkwọ a gara n'ihu kwuo na ọ bụ aghụghọ ka Nwosu jiri nata ochichi dịka ụkọchukwu n'aka Bishop nke Kasana-Luwerero bụ Right Rev. Paul Ssemogerere nke mba Tanzania n'ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Fabụarị 2020.

Akwụkwọ a kwukwara na nchụpụ a enweghị mmekwata kama na ọ kaara Nwosu mma ka o jiri aka ya gbaa onwe ya arụkwaghị m.

Ihe fada Oliver Nwosu kwuru

Fada Oliver Ekene Nwosu gwara ndị nta akụkọ ABS na oruola afọ ise ndị mmadụ na ndị nọ n'ọchịchị na-agba ya mgba okpuru.

O kwukwara na ọ gaghị akpọ aha ndị a.

Nwosu kwuru na enwebeghị akwụkwọ sị ya kwụsịtụ n'ọrụ ruterela ya ala ma sịkwa ndị mmadụ ha leghara akwụkwọ nkwụsịtụ ọrụ anya.

O kwuru na ndị ọchịchị ga-etinye anya na ya bụ okwu ma sịkwa na ọnọdụ a agaghị eme ka ọ hapụ ịrụ ọrụ Chineke kpọrọ ya mee.

Nwosu sị na ọ bụ iwu inyere ndị ogbenye na ndị na-enweghị etu ọ ha ha aka nke Pope Francis nyere, ka ọ na-eso.

O kwuru ka mmadụ niile tinye ya n'ekpere ma tinyekwa ụka nke Kraịst n'ekpere na oge na-adịghi anya na ihe niile ga-adị mma.

Ihe nduka Katọlịk nwere ikwu

Otu onye ụkọchukwu welitere isi n'ụka Katọlịk na-achọghị ka akpọ aha ya kwuru na ya bụ akwụkwọ bụ eziokwu.

Ọ kọwara na e nwere ụfọdụ ihe na-ezughị oke n'echichi ụkọchukwu e chiri Nwosu.

Aha nkeananụānụ, Etu esi gbuo Fada Paul Offu n'Ihe

O Kwuru na Nwosu hapụrụ Naijirịa gaa mba Tanzania were chie ụkọchukwu kama o gwaghị ha na ọ nwere nsogbu na Dayọsis ya n'Ọka.

O kwuru na ọ bụ ụlọụka nyere ya ikike ụkọchukwu ma ụlọụka nwekwara ịke ịnapụ ya ikike ahụ.