Fire Outbreak: Ọkụ agbagbuola Fada n'ụlọụka Katọlik

Ọkụ gbara otu Fada ebe a tọrọ nke ọzọ

Ebe foto si, Theophilus Ndulue

Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na ha na-enyocha ihe mere otu ụkọchukwu ọkụ gbagburu n'Nnewi, Anambra steeti.

Ọkụ agbagbuola otụ ụkọchụkwụ Katọlịk a kpọrọ Fada Edmond Nwagbala n'ụlọụka St. Peters Claver Katọlik dị na Nnewi Ichi Uruagu dị n'Anambra Steeti.

Ndị bi nso ebe ihe mere kwuru na ha n'ụlọ ha nụ ka ihe gbara ha gbapụta ị mara ihe dara ụdọ ahụ were hụ ọkụ na-agba n'ụlọ Fadaa ahụ 'ebe elekere mbụ nke isi ụtụtụ Satọdee.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Muhammed sị na ọkụ a malitere ịgba n'elekere anọ nke isi ụtụtụ 16 Nọvemba, 2019.

Ọkụ a na-amabeghi ihe kpatara ya gbara ebe obibi ụlọụka ahụ bụ ebe Fada Edmund Nwagbala dị afọ iri isii bi ma gbaa ya nke a na-amaghị onye ọ bụ.

ọkụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ nsogbu pụtara n'ụfọdụ steeti ebe e mere ọgbakọ nke okpuru ọchịchị a n'izu ụka gara aga

Haruna sị na ndị ọrụ nchekwa uweojii ngalaba Otolo nakwa ndị na-agbanyụ ọkụ wụchiri ebe ahụ bịa gbayụọ ọkụ a.

Ngwa ngwa ebu Fada Edmund gawa ụlọọgwụ mana e kwupụtara ọnwụ ya, e tinye zie ya n'ụlọozu maka nyocha.

Ọ sị na kọmishona ndị uwojii n'Anambra bụ John B. Abang enyela iwu ka a malite nyocha tara ọchịchị banyere nke a.

Aha onyonyo, Ọkụ ọgbụgba anapụla nwaanyị gbara afọ 92 ụlọ ya n'Enugwu

N'aka nke ọzọ, a tọrọla Fada ọzọ n'Enugwu

Fada a tọrọ

Ebe foto si, Theophilus Okwuchukwu Ndulue/Facebook

Ndị ntọrị tọrọ Fada Theophilus Ndulue, nke ụlọụka St. Patrick Katọlik Ihuonyia, Amansi-Odo, dị n'okpuruọchịchị Ezeagu n'Enugwu Steeti.

Nke a mere na mgbede ụbọchị Fraịde 15 Nọvemba, 2019, Mgbe o si nzukọ ndị ụkọchukwu na-alọta.

Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ụlọụka a bụ Fada Benjamin Achi mere ka a mata nke a.

Ọ sị na a tọrọ Fada Theophilus na onyeisi ndị ụmụnwaanyị bụ ha mechara tọhapụ dịka otu awa gachara mana Fada a ka nọ n'aka ndị a.

Ndị ntọrị a akpọbeghi ezinaụlọ Fada Theophilus maọbụ ndị isi ụlọụka maka ịjụ ajụjụ n'isi ya.

Nke a ga-abụ ugboro ise ndị ntọrị na-atọrọ ndị ụkọchukwu Katọlik n'Enugwu Steeti.