Akanu Ibiam Airport : Gọọmentị akụtuola ụlọ nwoke kwaturu ngwuru aja ọdọụgboelu n'Enugwu

Ebe foto si, Uche Maduemesi
- Onye dere ya, Ebere Ekeopara & Chigozie Ohaka
- Ndị mere akụkọ a, Reporter, Igbo Service
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Gọọmenti Enugwu steeti akụtuola ụlọ Arc. John Emejulu dị n' Eziokwe Street, Community Estate, dị na Trans-Ekulu, Enugwu site n'ụlọrụ ha a kpọrọ 'Enugu Capital Territory Development Authority', ECTDA.
Nke a na-eme dịka Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Mazi Hadi Sirika machara ọkwa na ha ga-akpụpụ Emejulu ụlọikpe maka ịkwatu aja ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu.
Sirika kwuru ụbọchị Tọzde na ọ bụ ihe ọjọọ na otu onye ga-akwatu ihe gọọmentị na-arụ ga-abara Naijiria niile uru.
Nke a mere ka Sirika gwa gọọmenti Enugwu ka ha gbaa mbọ ka aka kpara ya bụ nwa amadị.
Mana onyeisi ngalaba ECTDA bụ Josef Onoh onye nọ mgbe a na-ekutu ụlọ Emewjulu kwuru na ọ bụghị maka ọkwa Minista Sirika mara mere ha jiri kụtuo ụlọ ya.
Onoh kwuru sị "E nweghị ihe gbasara anyị na ikike ụlọikpe nyere nwoke a".
Ọ kọwara na ọ bụghị nanị ụlọ Emejulu ka ha kuturu, na ha kuturu ụlọ ndị a maka na ha nọchịri ụzọ ebe mmiri sị aga.
Ebe a bụ ala apịtị na mmiri ndị mmadụ were aja wuchie ma rụo ụlọ n'elu ya.
Onoh mere ka BBCIgbo mara na ihe dịka ụlọ isii nọ ebe ahụ adawala n'ihi na ala ahụ esighị ike.
O kwuru sị "ọ bụ kamgbe afọ 2018 ka ewepụtara ụlọ ndị a maka ikutu, ebidola ikpe a tupu m bụrụ onyeisi ụlọọrụ ECTDA".
O kwukwara na enweghị ihe jịkọrọ Enugwu steeti na ala ọdọụgbọelu Akanu Ibiam.
Onoh kwuru na ikpe Emejulu nwere bụ ya na gọọmentị etiti nwere ya.
Onoh kwuru na ọ bụ ihe ndaba mere o ji dịka gọọmentị a na-abọkwara maka ihe Emjulu mere.

Ebe foto si, Uche Maduemesi
Lee ya n'ihe nkiri ka o si mee ebe a:
Nchọpụta BBC mere gosiri na ya bụ nwoke bụ John .J. Emejulu bụ onye nyochara nnukwu ala ahụ gọọmenti weghara ma nwekwaa ọtụtụ ala ebe ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Na afọ 2016, ka gọọmenti Enugwu kwaturu ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ rụrụ ebe ahụ ma weghara ya bụ obosara ala dịka ebe ha ga eji mee Free trade Zone.

Ebe foto si, Getty Images
Emejulu na ndị obodo Nike nakwa ndị nwere ala na ụlọ ebe ahụ kpụpụrụ gọọmenti Enugwu n'Ụlọ Ikpe n'ihi na anaghara ha ala ha ma kwatuo ụlọ ha n'ike na-akwụghachịghị ha ụgwọ ọbụla.
Mazi Emejulu kpọrọ ndị ọrụ were iwe ga ụbọchị wenezde August 12 ga kwatuo ya bụ fenci ejiri gbachie ala ahụ.
Dịka Sirika siri kwuo, gọọmenti ewegharala ala ndị ahụ ma na achọkwa JJ Emejulu ka ọzara ọnụ ya.










