Mbonu Ojike: Ihe ị kwesịrị ịma maka dimkpa Igbo a

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Gịnị ka ị ma maka Maazị Mbonu Ojike?
Kedụ nke a ga-akpọpụta nwoke a abụghị?
Odeakwụkwọ? Ọgụegwu? Onye nkuzi? Onye ndọrọndọrọ ọchịchị? Kedụ nke a ga-akpọpụta aka ya adịghị n'ime ya?
Ojike so na ndị Igbo nwere oke ọgụgụ isi mere ka a mara ya amara oge ọ dị ndụ.
E mechara mara ya maka okwu ọ na-ekwukarị bụ "Boycott all boycottables" na Bekee, nke pụtara "gọpụ onwe gị ma ọ bụrụ na ọ dabaraghị gị".
Lee anya ka BBC Igbo kọwaara gị maka ya.
Ihe ị kwesịrị ịma maka Mbonu Ojike:
- A mụrụ ya n'afọ 1914, n'Arọndịizuogụ dị n'Imo steeti
- O kwetara na nwoke ịlụ karịa otu nwaanyị, mere ka ọ lụọ nwunye abụọ
- Dịka akụkọ si kwuo, ọ banyere otu a na-akpọ Ogboni, ebe ọ nọ ruo oge ọnwụ
- Ọ gụrụ akwụkwọ na Naịjiria, kuzikwaa nkuzi ma gaa ụlọakwụkwọ maka ndị chọrọ ịbụ ndị nkuzi
- O mechara gụọ akwukwọ na mba Amerịka, na mahadum "Lincoln University, University of Illinois nakwa Ohio State University", ebe ya na ndị dị ka Ozumba Mbadiwe zutere ma bụrụ enyi
- Ka ọ nọ na mba ofesi, o dere ụfọdụ akwụkwọ gbasara omenaala Afrịka nakwa gbasara ịkpa oke ndị ọcha na-akpaso ndị isi ojii
- Ị ma na ọ gụkwara egwu? Ọ bụ ihe ndị Bekee na-akpọ "choirmaster" oge ọ na-akuzi nkuzi, ma na-akpọkwa ụbọ "piano"
- O dere ozi mwute gbasara ọnwụ mmadụ 21 na-egwuputa unyi ndị ọcha gburu n'Iva Valley dị n'Enugwu
- O jighi Afrịka egwu egwu, nke bụ na onye ma ya ma na ọ ga-ebu ụzọ họrọ ihe ọbụla bụ njirimara Afrịka dịka ejiji, nri, egwu, mmanya ngwọ nakwa ihe ndị ọzọ, tupu o kwute okwu nke Bekee.
- Maka etu ihe gbasara Afrịka si anụ ya ọkụ n'obi, o kwetara ịbụ osote onyeisi otu pati National Council of Nigeria and the Cameroons (NCNC) bụ nke Herbert Macaulay hibere, ebe ọ zọrọ ọkwa ma nweta oche ịnọchite anya Legọs steeti n'ụlọomeiwu.
- N'afọ 1951, e mere ya osote 'Mayor' nke Legọs steeti ebe ọ nọ ruo afọ 1953 mgbe ọ nwetara oche n'ụlọomeiwu nke mpaghara ọwụwa-anyanwụ
- Ọ rụkwara dịka Minista na-ahụ maka Ọrụ nakwa nke na-ahụ maka Akụnaụba, n'afọ 1954; ebe ọ nọ ruo afọ 1956
- Ị gaa Owere, ị ga-ahụ ụzọ a gụrụ aha ya n'Ikenegbu, nakwa n'Ụmụahịa nakwa na Surulere dị na Legọs, ya na Fegge dị n'Ọnịcha
- Ọ nwụrụ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Nọvemba nke afọ 1956, ka ọ dị naanị afọ 42.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:










