Ohaneze,Massob asaala Northen Elders Forum: " Asị! ọ bụ ndị ugwu na-egbu ọtụtụ ndị Igbo kamgbe"

Nnia Nwodo na Ango Abdulahi

Ebe foto si, BBC/Nyesom Wike

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Ohaneze Ndigbo Igbo agbarụọla ihu maka ihe ha kpọrọ "okwu asị" na "okwu na-akpalị iwe" nke Onyeisi ndị otu jikọrọ ndị okenye ndị Ugwu, a kpọrọ"Northern Elders Forum" bụ Ango Abdullahi kwuru.

Northern Elders Forum eboro ndị Igbo ebubo aka ha ịdị na mmebi ihe nakwa ogbugbu ndị Ugwu n'ọgbaghara dapụtara oge EndSARS mere na nson nso a ma kwuo na ọ bụ ndị Igbo kachas i emekpa ndị Ugwu ahụ n'Ndịda Anyanwụ.

Mana n'akwụkwọ mgbasaozi ozi onyeisi otu Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo depụtara sitere n'aka onye ndụmọdụ mgbasaozi bụ Emeka Attamah n'ụbọchị Wednezde(itolu nke ọnwa Disemba), otu ahụ jikọrọ ndị Igbo kwuru na ụdị okwu ahụ sị n'ọnụ 'Northern Elders Forum' "nwereike ibute ezigbo ọgbaaghara na Naijirịa".

Nwodo, onye kwuru na ihe Abdullahi kwuru bụ ihe nwere ike ịkpalite ogbugbu ndị Igbo bi n'Ugwu Awusa,kwuru na okwu ya "ga-etinye ndụ ndị Igbo bi Ugwu n'ize ndu."

Ọ gwara NEF na ọ bụ ndị Igbo ka ndị Ugwu kacha egbu kemgbe.

"Ndi Igbo bụ ndị ụmụnne anyị ndị Ugwu na-awakpo na-egbusịsị kwa mgbe, ụfọdụ mgbe maka ihe mere na mba ofesi, nke o nweghị ụgwọ akwụrụla maka mbibi ndị a."

Nwodo gwakwara Abdullahi na ọ bụghị nanị maka ọtụtụ ndị Igbo ndị Ugwu na-egwu, kama ọtụtụ akụnụba ndị Igbo na-ala n'ihi oge ọgbaaghara ndị a.

Ebe ógbaaghara dara

Ebe foto si, Getty Images

Nwodo dọkwara Abdullahi aka na ntị ka ya mara etu o si ekwu ọkwụ ọkachasị ugbua Naijirịa nwere etu o siri debe isi ma ya mara na ọ dị mkpa ka ọ were ndụ ya fọro afọ hụ na ọkwụ ya ga-enyere aka n'ọdịmma Naijirịa.

Ha pịachiri ya bụ akwụịkwọ ozi dịka Nwodo kwuru ka gọọmentị Naijirịa gwa ndị NEF ka ha weghachi okwu dị etu a nwereike ibute ọgbaaghara.

MASSOB asakwaala Northen Elders Forum: 'Ebum n'obi Ango Abdullahi n'ọwụwa anyanwụ agaghị emezu'

Ndị na-achọ mmwere onwe Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Ndị otu Movement for the Actualization of the Sovereign State Of Biafra bụ MASSOB n'aha ịchafụ azaala onyeisi Northern Elders Forum bụ Ango Abdullahi maka ebubo o boro ndị Igbo na ha gburu ndị ugwu oge ngagharịiwe endsars.

Ndị ọchịchi otu MASSOB esitela n'akwụkwọ ozi onyeisi mgbasa ozi ha bụ Edeson Samuel zahachi Abdullahi were kwuo na o nweghị mgbe eji egbu ndị ugwu bị n'ọwụwa anyanwụ kama na ọ bụ ndị Arewa na-egbu ndị Igbo na mpaghara ugwu.

Ha kwuru na obum n'ụche Abdullahi o ji mee njem na Rịvas steeti amụtaghị mkpụrụ, were sị "ọ bụ atụmatụ mgbasa nke ha ga-eji were ọchịchị nke ha hụtara Nyesom Wike dịka onye ha ga-eji rụọ ọrụ a".

Aha nkeananụānụ, 'Nnamdi Kanu na-arụrụ gọọmenti Naịjirịa ọrụ' - Ralph Uwazuruike

MASSOB kwuru na Abdullahi chọrọ ibute esemokwu n'etiti ndị Igbo na ndị nọ n'ọdịdị Naijirịa.

Ha kwuru sị ," Ango Abdullahi bụ ihe ọjọọ mere ndị ntoroobịa Arewa, n'ihi na ọchọghị ịnye ha ohere agụm akwụkwọ, ohere ịkpe ofufe etu ha si chọọ na ohere ị bara onwe ha uru".

Ndị MASSOB duru ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ ka ha hapụ ịnabata Ango Abdullahi na ndị sọ ya n'ihi na ọ kparịrị ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ na ndị Igbo niile.

Tigbuo-zọgbuo a na-emegide ndị Ugwu n' Ọdịda Anyanwụ kachasị n'aka Ndigbo- Northern Elders Forum

Ango Abdullahi na úgbúala ndí Ugwu a gbara ókú

Ebe foto si, Nyesom Wike/Usman Ibrahim

Otu jikọrọ ndị okenye ndị Ugwu, a kpọrọ 'Northern Elders Forum' (NEF)na Bekee eboola ndị Igbo ebubo aka ha ịdị na mmebi ihe nakwa ogbugbu ndị Ugwu n'ọgbaghara dapụtara oge EndSARS.

Dịka Ụlọntaakụkọ Vanguard siri kwuo, ọ bụ onye ndu otu ahụ bụ Ango Abdullahi bụ onye kwuru nke a ụbọchi Tuzde oge otu NEF na ndị Ugwu bi na Rivas steeti nwere ọgbakọ ka ha gara njem ileta ha n'azụ ọgbaghara EndSARS.

"Ihe na-atụ anyị n'anya bụ na ndị na-eme tigbuo zọgbuo megide ndị Ugwu bụ otu ndị ahụ kachasị eti mkpu na-akpọ okpu ka eti ha aka n'obi."

Nyesom Wike oge otu 'Northern Elders Forum' gara zute ya

Ebe foto si, Nyesom Wike/Facebook

Nkọwa foto, Ndị NEF oge ha gara ịhụ gọvanọ Nyesom Wike na obi gọọmenti

N'okwu ya mgbe ha bịara izute ya n'obi gọọmenti na Pọtakọt, Gọvanọ Rịvas steeti bụ Nyesom Wike kwere ha nkwa na ọchịchị ya agaghị emegide agbụrụ ọbụla na steeti ahụ.

Wike sịrị, " Oke na ọrụ gọọmenti bụ ichekwa akụ na ụba na ndụ ndị mmadụ. Ọ dịghị etu a, ị mara na enweghị ezi ọchịchị."

Ndị Ugwu bịara ọgbakọ ahụ

Ebe foto si, Usman Ibrahim

Ndị Ugwu bịara ọgbakọ ahụ

Ebe foto si, Usman Ibrahim

Ndị so Abdullahi gaa ya bụ ije gụnyere onye bụbụ onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Ghali Umar Na'Abba; ọnye zọburu ọkwa onyeisiala n'aha pati NRC Bashir Othman Tofa na ndị ọzọ.

'Ụjọ na agụụ ji anyị n'Oyigbo kemgbe abalị atọ ruo ugbua'- Onye bi n'Oyigbo

Ụfọdụ ezi dị n'Oyigbo tọgbọọ chakoo

Ebe foto si, Ejike Samuel Akomas

Oyigbo dị na Rivers Steeti bidoro wube na soshal media ọzọ taa bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Novemba 2020.

Ndị mmadụ nọ na soshal midia na-ajụ ihe mere e ji gbachi nkịtị maka oke ogbugbu ka na-eme ebe ahụ.

Nke a mere ka anyị kpọọ otu onye bi n'ogbe ka ọ gwa anyị nke na-eme ebe ahụ ugbua.

Ejike Akomas kwuru na ha zoro n'ime ụlọ kemgbe abali atọ dịka ndị agha ezitere ka ha wegahchite udo n'Oyigbo na-akwa mgbọ iji hụ na ha wetere nchekwa n'ebe ahụ.

O kwuru na mgbọ ahụ ndị agha na-akwa, na-enye ha na ụmụ ha nsogbu.

Akomas kwuru na ndị kpara arụ a kpatara ndị agha ji wuchie iche ebe ahụ nche agbalagala mana ndị bi n'Oyigbo na-atazi ahụhụ ya.

N'ọnụ ya, "kemgbe abali atọ, anyị enwetebeghị ihe oriri maọbụ ọgwụ igwọ ọrịa na-arịa ụfọdụ ndị bee anyị maka mmachi e etinyere n'obodo anyị.

Nnamdi Omoni bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na iwu mmachị ka na-aga n'ihu n'obodo Oyigbo, ndị uweojii na ndị agha ezigara ebe ahụ ka nọ ebe ahụ, ya enwetabeghị mkpesa maka

nsogbu ọbụla si ebe ahụ apụta.

Omoni kwuru na ọ bụrụ na a na-egbu ndị mmadụ dịka akụkọ si efegharị na soshal midia na a ga-enwe ozu ndị si na ya bụ ogbugbu pụta, ọ gara n'ihu kwuo na akụkọ ahụ nke ndị omekome ji etinye ụjọ n'obi ụmụ Naịjiria.

O kwuru na Oyigbo juru oyi ugbua.

Cheta na ọgbaghara si na ngaghariwe End SARS malite mere ka gọọmenti Rivers steeti tinye mmachị ngaghari na steeti ahụ ruo ugbua.

EndSARS: Ihe mere ndị Ugwu ji gbahapụ Rivers steeti na obodo ndị gbara ya gburugburu

Ụgbọala na-agba ọkụ

Ebe foto si, Usman Tudunwada

Otu n'ime mpụtara ngagharịiwe End SARS bụ na ụfọdụ ndị Ugwu na-azụ ahịa na ndida Naijiria, agbahapụwala Rịvas steeti na obodo ndị gbara ya gburu gburu ọsọ n'ihi egwu.

Ndị ojiegoachụ ego n'ime ha kpebikwara ịkwụsị ibute ngwanrị na mpaghara ahụ.

Nke a na-abịa dịka ọgbaghara so ngaghariiwe EndSARS tara isi ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị Ugwu ebe ngwa ahịa ha nakwa ụgbọala ha ji ebu ahị so na ihe a gbara ọkụ na Rịvas steeti na steeti ndị ọzọ gbara ya gburugburu.

Ụgbọala a gbara ọkụ

Ebe foto si, Usman Tunwada

Onyeisi otu ACF ngalaba nke Rivas steeti bụ Usman Ibrahim Tudunwada ksịị, "Ọtụtụ ndị be anyị, ọkachasị ndị e merụrụ ahụ (n'ọgbagharaEndSARs) bidoro na-alaghachi Ugwu n'ihi ihe mere."

'Anyị ga-akwụsị ibute ngwa nri na Rivas'

Usman Ibrahim

Ebe foto si, Usman Ibrahim

Nkọwa foto, Usman Ibrahim, onyeisi Arewa Consultative Forum na Rivas steeti kwuru na e gburu ọtụtụ ndị otu ha n'ọgbaghara so EndSARS

Na nsonso, otu 'Arewa Consultative Forum'(ACF), ngalaba nke Rivas steeti kwuru na ha ga-akwụsị ibute ihe oriri na Rịvas steeti nakwa mpaghara Ndịda Anyanwụ n'ihi ajọ agwa ndị a na-enyo na ha bụ ndị otu Ipob kpasara ha na steeti ahụ n'ọgbaghara so ngagharịiwe EndSARS na steeti ahụ.

Usman Ibrahim

Ebe foto si, Usman Ibrahim

Usman Ibrahim Tudunwada, onye bụ onyeisi otu ACF na Rivas steeti gwara BBC Igbo na ihe butere ya bụ mkpebi bụ na a gbaara ụgbọala gwongworo ha ji ebu ahịa nakwa ngwahia ha ọkụ ma gbuo ụfọdụ ndị otu ha na n'ọgbaghara so ngagharịiwe EndSARS.

"Ndị Ipob gburu ndị otu anyị mmadụ iri"

" Anyị nwere mmadụ iri ndị otu Ipob gburu. Anyị ka na-achọkwa ise, ebe mmadụ iri na abụọ merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ."

Tudunwada na-arụ ndị otu Ipob aka dịka ndị kpara mkpamkpa ahụ dịka o kwuru na ndị mere ya bụ ihe ji ngwa e jirimara ndị Ipob.

Ndị Ugwu gbara ili onye nke ha nwụrụ na nsogbu EndSARS

Ebe foto si, Usman Tudunwada

Nkọwa foto, Ndị Ugwu gara ili onye nke ha nwụrụ na nsogbu EndSARS

Ya mere o jiri were na-ajụ sị, "Kedụ ihe anyị ga-eji na-ebutere ndị na-egbusisi anyị ma na-agba ngwahịa anyị ọkụ?"

Na nsonso a, ndị a na-eche na ha bụ ndị otu Ipob wakporo ndị Ugwu na Oyigbo na Iriebe dị na Rivas, mebie ngwahịa ha ma gbaa ụgbọala ha ọkụ na Oyigbo na nsonso a.

Uli ózú

Ebe foto si, Usman Tundunwada

Dịka gọvanọ steeti ahụ bụ Nyesom Wike siri kwuo, "Ipob gburu ndịagha isi, ndị uweojii anọ ma gbaa ogige ndị uweojii ọkụ," ma mebikwa ọtụtụ ihe ọha nakwa ndị nọrọ onwe ha nwe.

Nyesom Wike

Ebe foto si, Nyesom Wike/Facebook

Mana Wike enweghị ihe o kwuru maka ọnụọgụgụ ndị nkịtị gunyere ndị Ugwu e gburu n'a ọgbaghara ahụ.

Ụgbọala na-agba ọkụ

Ebe foto si, UsmanTudunwada

Kọmịsọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Paul Nsirim azaghị ekwenti ya nke ọ na-asa ozi e zigara ya n'ekwentị maka ebubo nke ndị Ugwu nọ na steeti ahụ na-ebo.

N'otu aka ahụ ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii steeti ahụ bụ Nnamdi Omoni gwara BBC na ọ ga-akpọchị anyị inye ọsịsa na-ajụjụ ebubo ndị Ugwu e gburu.

Ọzaghị ekwentị ya oge a kpọghachiri ya nke o ji asa ozi e zigara ya n'ekwentị.

Mana otu Ipob na-agọ na aka ha adịghị na ihe e mebiri na Rivas steeti.

Ọkaiwu otu ahụ bụ Aloy Ejimakor kwuru na ọ bụ ndị ntorobịa mere ọgbaghara, na ọ bụghị otu Ipob.

Ọkaiwu Aloy Ejimakor

Ebe foto si, Aloy Ejimakor

Nkọwa foto, Ọkaiwu Ipob bụ Aloy Ejimakor sị, "A na-ebochikarị ndị otu Ipob ọnụ."

"A na-ebochikarị ndị otu Ipob ọnụ. Ebe ọbụla Onye Igbọ na onye Ugwu nwere nghọtahịe, asị na ọ bụ ndị Ipob."

Ọ gara n'ihu sị o kwesịrị ka ndị uweojii nyocha ya bụ ihe,o nwee onye ntọrọbịa mere mpụ, sị gbaso Iwu Naijiria were taa ya ahụhụ.

N'okwu na ndị Ugwu ga-akwụsị ibute ngwanrị n'a Ndịda Naijiria, " ọkwurụ na ọ bụụ na ndị Ugwu nwere obi one Naijiria

Ka ọ dị ụgbua, e nwela ụkọ ụfọdụ ngwa nri a na-esi na Ugwu Naijiria ebute na Ndịda-Anyanwụ, ebe ọnụahịa ụfọdụ nri si Ugwu abịa dịka ịyabasị gbaliri elu n'ihi oke ụkọ.

Ndị ụfọdụ ụmụnwaanyị kwụpụtara, alibasa a na-azụbu otu narị naira bụzị narị naira atọ maọbụ karịa.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ahịa alịbasa so n'ihe a gbara ọkụ na ọgbaghara ahụ.

Aha onyonyo, 'Ndịagha agaghị agọ na ha agbaghị mmadụ egbe na Lekki Toll Gate n'ihi na e bugara m ọtụtụ ụlọọgwụ'

Akụkọ ndị ga-amasị gị: