Lee ebe niile ndị Arochukwu gbara mgbọrọgwụ n'ụwa

Ikeji ndị Arochukwu
    • Onye dere ya, Chris Sanctus Okereke
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist

Ndị obodo Arochukwu a na-akpọ Aro na mkpọbiri bụ otu n'ime ndị kachasị eme njem n'ala Igbo.

Ebe ọbụla ha gara ha na-agba ezigbo mgbọrọgwụ ebe ahụ.

Ndị Arochukwu bụ ndị mgbọrọgwụ ha malitere n'Abia Steeti ma nwee ogbe karịrị otu narị na iri na atọ (113) bụ ebe ndị obodo ha bigasị.

Gịnị mere ndị Aro ji gbasaa etu a?

Mazi Chima Dike

Ebe foto si, Mazi Chima Dike

Nkọwa foto, Maazị Chima Dike bụ onye omenala ndị n'Arochukwu doro anya

Maazị Chima Dike kọwaara BBC Igbo ka ndị Arọ siri gbasaa ebe niile.

N'olu ya, "Ọ bụ ịzụahịa bugara ndị Aro ebe niile ha nọ n'ala Igbo nakwa mbaụwa gbaa gburugburu".

Ọ sị na ọ bụ ịgba ohu bụ ahịa ndị Aro jiri malite ịzụ ahịa n'agbata afọ 1500 ha na ndị Pọtugal, tupu ndị Briten abatazịa ebe 1901 na 1902.

O kwuru na ịgba ohu guzowere na nkwenye chi Ibini Ụkpabi bụ oke Arụsị Igbo niile tụkwasara obi maka nchekwa.

Aha onyonyo, Lee emume iri ji ndị Arochukwu

Nke a mere e ji akwaneyere ndị Aro ugwu ebe ọbụla ha nọ.

Ụfọdọ na-akpọbata ndị Aro n'obodo ka ha nyeaka ichekwa obodo n'aka ndị na-agba ohu nakwa ndị na-ebuso ha agha.

Ebe ọbụla ndị Aro nọ ndị obodo ahụ na-akwanyere ha ugwu dịka ndị bụ ọnụ na-ekwuru Ibiniụkpabị, mere e ji enye ha ọnọdụ ka diala n'ebe ndị ahụ.

A na-atụkwasị ndị Aro obi dịka ndị eziokwu na ndị na-ekpe ikpe kwụ ọtọ, nke mere ha jiri bụrụ ndị ọkaikpe n'obodo ndị a.

Ha na-eburu ndị meruru ala nye Ibiniụkpabi dịka ohu ha na-ere n'ofesi ebe ndị nwe ha agaghịzi ahụ ha anya.

Nke a mere ndị Igbo jiri were gbasaa na mba niile n'ụwa.

Ọ bụ ya mekwara Igbo niile ji akwanyere ndị Arọ ugwu pụrụiche nke turu ndị ọcha n'anya mgbe ha batara n'ala Igbo.

Nke a mere ndị ọcha ji na-ebuso ndị Aro agha, iji kwatuo ọchịchị ha ma napụkwa ha ụfọdụ ike ha nwere.

Ụbọchị ọzọ ka a chụọ ntaakụkọ agha a n'owere nchi.

Mana mgbe nwabekee meriri ya bụ agha, ịgba ohu kwụsịrị, ndị Aro malitezie ire mkpụrụ nkwụ na mmanụ nri sitekwa n'otu ụzọ ahụ ha si zụọ ahịa ohu.

Ikeji ndị Arochukwu

Lee ebe ndị Arọ nwechara obi

Biko buru n'obi na a ka na-ebepụtakwa ebe ndị ọzọ na-adịghị ebe a.

  • Aro Ajatakiri dị n'Ikwuano nke Abia Steetị
  • Aro Achara - Isialangwa, Abia.
  • Aro Okporoenyi - Bende, Abia
  • Aro Ayama - Ikwuano, Abia.
  • Aro Amuru - Ikwuano, Abia.
  • Aro Ngwa - Abia State.
  • Aro Ama-Asa - Isialangwa, Abia.
  • Aro Umunkpe - Isialangwa, Abia.
  • Aro Nbawsi - Isialangwa, Abia.
  • Aro Omoba - Isialangwa, Abia.
  • Aro UmuEru - Isialangwa, Abia.
  • Aro Umuaro - Isialangwa, Abia.
  • Aro Onicha Ngwa.
  • Aro Isuochi - Abia.
  • Aro Ahuma Abam - Abia.
  • Aro Nde Ijere - Ohafia - Abia.
  • Aro Agbagwu - Uzuakoli- Abia.
  • Aro Ndizuogu gụnyere Ideato, Okigwe na Onuimo bụ okpuruọchịchị atọ d'Imo Steetị.
  • Aro Ugwuta - Imo.
  • Aro Izombe - Imo.
  • Aro Oru - Imo.
  • Aro Oji - Owerri - Imo.
  • Aro Ihite Owerri - Imo.
  • Aro Iheosu - Imo.
  • Aro Awa- Imo.
  • Aro Mbana - Imo.
  • Aro Atta Ikeduru - Imo.
  • Aro Umunneoha - Imo.
  • Aro Iheagwa - Imo.
  • Aro Ndi Ikerionwu - Anambra.
  • Aro Ajali - Anambra.
  • Aro Azia - Anambra.
  • Aro Abagana - Anambra.
  • Aro Ndi-Owu - Anambra.
  • Aro Isiokpo - Ikwerre - River state.
  • Aro Igirita - Ikwerre - Rivers State.
  • Aro Kalabari - Rivers State.
  • Aro Opobo - Rivers state.
  • Aro Ikpa - Enugu.
  • Aro Amokwe -Udi Enugu.
  • Aro Ezeagu - Enugu.
  • Aro Achi - Enugu.
  • Aro Nkalagu - Ebonyi.
  • Aro okposi - Ebonyi.
  • Aro Onueke [Ezza] - Ebonyi.
  • Aro Nsukka - Enugu.
  • Aro Nzerem - Ebonyi.
  • Aro Ikwo - Ebonyi.
  • Aro Ndi okoro - Akwa Ibom.
  • Aro Ikot Ukana - Akwa Ibom.
  • Aro oboro ite - Akwa Ibom.
  • Aro Idoma - Ukpabi of Ochu Idoma - Benue State.
  • Aro Umudara Njiaba - Imo.
  • Aro Umuejike Njiaba - Imo
  • Aro Nempi - Oru west - Imo.
  • Aro ibiasoegbe - Mgbidi - Imo.
  • Aro Ezial - Mgbidi - Imo.
  • Aro Ugbele- Mgbidi - Imo.
  • Aro Uzun'umu-mgbidi - Imo.
  • Aro Eleh-oru West - Imo.
  • Aro Ubulu-Oru West - Imo.
  • Aro Nde Ikokwo-Uli - Anambra.
  • Aro Ndi Egungwu-Uli - Anambra.
  • Aro Ubuluisiuzo-Ihiala - Anambra.
  • Aro Umuezeawara-Ihiala - Anambra.
  • Aro Iseke-Iheala - Anambra.
  • Aro izzi - Ebonyi.
  • Aro Awonmanma-Oru East - Imo.
  • Aro Otulu-Oru East - Imo.
  • Aro Amiri-Oru.
  • Aro Mbiabong
  • Aro Nturi
  • Aro Nta- Mbaise Imo
  • Aro Itunta- ikwuano, Abia.
  • Aro Effium - Ebonyi
  • Ekwebiri- Ihechiowa
  • Onyi na anya - Ihechiowa
  • Aro Egbelubi, Ngor okpala, Imo
  • Aro Umuokoro, Ngor okpala, Imo
  • Aro Alugulu, Ngor okpala, Imo
  • Aro Okpoto, Ebonyi
  • Aro Ntezi, Ebonyi
  • Aro Ohafia Oduma, Ebonyi.
  • Aro Ndi Okpareke, Orumba North LGA, Anambra state
  • Aro Ndi Okpareze, Orumba North LGA, Anambra state
  • Aro Ndi okoro, Awka - Anambra.
  • Aro Ndi ukwuenu, Awka -Anambra.
  • Aro Oboro, ikwuano- Abia.
  • Aro Nkalunta, ikwuano- Abia.
  • Aro Ubibia, Bende-LGA, Abia.
  • Aro Bende- Bende LGA, Abia.
  • Aro Ntalakwu - Bende LGA, Abia.
  • Aro Eziala - Nsulu, Isialangwa, Abia.
  • Aro Okuku - Owerri, Imo.
  • Aro Amokwe - Udi, Enugu.
  • Aro Aguobu - Ezeagu, Enugu.
  • Aro Orji- Owerri North, lmo.
  • Aro ikembara - ikeduru, Imo.
  • Aro Isu, ohaozara -Ebonyi.
  • Aro Onicha,ohaozara- Ebonyi.
  • Aro Uburu, ohaozara - Ebonyi.
  • Aro Akaeze, ohaozara -Ebonyi.
  • Aro Abaomege - Ebonyi.
  • Aro Nkerefi - Enugu.
  • Aro Mbrubu - Enugu.
  • Aro Okpanku - Enugu.
  • Aro ishiagu - Ebonyi.
  • Aro Oshiri - Ebonyi.
  • Aro Iyonu - Ebonyi.
  • Aro Ezilo - Ebonyi.
  • Aro Ezaa - Ebonyi.
  • Aro Afikpo - Ebonyi.
  • Aro Ososu, isialangwa

Aro nwekwere ọtụtụ ogbe n'ala Bekee.

Anyị ga-edepụtakwa ha ebe a mgbe anyị ga-enwete ha.

Ọtụtụ ndị a na-ahụtazị onwe ha dịka ndị obodo ahụ n'agbanyeghị na ọtụtụ n'ime ha ka na agakwa Arochukwu.

Kedụ ihe jikọtara ndị Aro niile ugbua?

Ugbua ọtụtụ n'ime ndị Aro niile a ka na aga Ikeji n'Arochukwu kwa afọ.

N'ọnwa Septemba afọ dum, ọtụtụ n'ime ha na-aga Arochukwu ịwere nzu na-enye ha ikike ịme Ikeji nke ha n'ụlọubi ha.

Nke a bụ ụzọ ndị Aro niile a si emekọrịta ruo echi.

Akụkọ ga-amasị gị