'Ipob na Ohaneze ekpeziela mana o nweghị mgbe ha ji kwuo maka ọkwa onyeisiala Naịjirịa' - Ohaneze/Ipob

Okeke-Ogene na Ejimako

Ebe foto si, Damian Okeke/ Aloy Ejimako/Facebook

Nkọwa foto, Damian Okeke-Ogena na Aloy Ejimako nọ na ya bụ ọgbakọ Ipob na Ohaneze ndị Igbo nwere n'Anambra nakwa Enugu steeti

Otu n'ime isiokwu pụtara n'ụtụtụ a bụ na Ohaneze ndị Igbo na ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ekwekọrịtala ịchụwa ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023.

Mana nke a abụghị eziokwu ma ọlị.

Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimako ya na Onyeisi ndị Ohaneze ndị Igbo n'Anambra steeti bụ Damian Okeke-Ogene, ha abụọ kwuru otu olu na ya bụ okwu.

Ha sị na ọ bụ ezie na Ipob na Ohaneze ekpeziela mana ọnweghị mgbe ha jiri kpaa maka ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'ọgbakọ ha nwere izuụka gara aga.

Ha abụọ kwuru na ya bụ mkparịtaụka anyị na ha nwere iche iche n'ekwentị, na Ohaneze na Ipob nwere nkwekọrịta nke ha iche iche, na isi okwu ha bụgodi ịkpe udo n'ime ha, ọbụghị ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

Gee olu Damian Okeke-Ogene na Aloy Ejimako

Aha onyonyo, Ipob na Ohaneze ekpeziela mana ọnweghị mgbe ha ji kwuo maka ọkwa onyeisila Naịjirịa

Mgbe ọ na-aza ajụjụ maka ihe mere Nnamdị kanu jiri wee iwe were kwụọ na Radio Biafra na Ohaneze gbara ihe ha kpatara n'anwụ, Ejimako kwuru na ọ bụ ezie na ya bụ ihe wutere onyeisi ha bụ Nnamdị Kanu, mana ọbụghị Nnia nwodo maọbụ otu n'ime ndị isiọchịchị nwere agba n'Ohaneze tinyere aka na ya bụ akwụkwọ ozi.

O kwukwara na "Onyeisi Ipob bụ Nnamdị Kanu agwala ndị otu ya ka ha gharazị ikwu ihe ọbụla maka ihe ahụ Ohaneze ndị Igbo dere".

N'olu Ejimako, "Ohaneze na Ipob bụ ụmụnne".

Ihe ha gbara na nzukọ ha nwere bụ izu maka ọdịmma ndị Igbo.

Mgbe BBC rịọrọ Ejimakọ ka ọ zụnyetụ anyị ohiụka maka mpụtara ya bụ nzụkọ, Ejimakọ kwụrụ na nkwekọrịta ha bụ na "o nweghị ihe ga-eme ka ha gwa onye ọbụla ihe ha kwutere na ya bụ izu."

Akụkọ ga-amasị gị